Bible n'ime otu afọ June 241 IHE EMERE 11:1-461. Israel nile we chikọta onwe-ha n'ebe Devid nọ rue Hebron, si, Le, ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu.2. Na mb͕e gara aga, ọbuná mb͕e Sọl bu eze, gi onwe-gi bu onye nēdupu na onye nēdubata Israel: Jehova, bú Chineke-gi, we si gi, Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú ndim, bú Israel.3. Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n'aka Samuel si di.4. Devid na Israel nile we jerue Jerusalem (nke ahu bu Jebus); ma n'ebe ahu ka ndi Jebus, ndi bi n'ala ahu, nọ.5. Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n'ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.6. Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi.7. Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike; n'ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid.8. O we wue obodo buruburu, site na Milo we rue buruburu ya: ma Joab mere ka obodo fọduru di ndu.9. Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.10. Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n'akuku ya n'ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel.11. Nka bu kwa ọnu-ọgugu ndi-dike Devid nwere: Jashọbeam, bú nwa onye-Hakmonait, onye-isi nke orú na iri ahu; o feghariri ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u n'otù ub͕ò.12. Nke so ya bu Eleeza nwa Dodo, onye Ahoa, onye ahu di n'etiti ndi-dike atọ ahu.13. Onye ahu nọyere Devid nime Pas-damim, ma ndi Filistia chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, òkè ubi nke juputara n'ọka barley di kwa; ma ndi Israel b͕alagara n'iru ndi Filistia.14. Ha we guzo onwe-ha n'etiti òkè ahu, naputa ya, tib͕ue ndi Filistia; Jehova we zọputa nzọputa uku.15. Ndikom atọ n'etiti orú ndi-isi na iri ahu we ridarue oké nkume ahu jekuru Devid, rue ọb͕à Adulam; ma ọmuma-ulo-ikwū ndi-Filistia amawo ulo-ikwū-ha na ndagwurugwu Refaim.16. Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.17. Devid we chọsie ike, si, Ònye gēme ka m'ṅua miri sitere n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama?18. Ndikom atọ ahu we wapue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia, sere miri n'olùlù-miri Bet-lehem, nke di n'ọnu-uzọ-ama, ha we būru ya, kutere Devid: ma Devid ekweghi iṅu ya, o we wusiere ya Jehova,19. si, Ya burum ihe-árú sitere na Chinekem, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha je? n'ihi na ha ji ndu-ha n'aka-ha kute ya. O kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.20. Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.21. N'etiti ndikom atọ ahu anāsọpuru ya kari abua fọduru, o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.22. Benaia nwa Jehoiada, nwa nke nwoke bu dìnkpà nke Kabzeel, onye di uku n'ime ihe, onye ahu tib͕uru umu-ndikom abua nke Ariel nke Moab: onye ahu rida-kwa-ra tib͕ue ọdum n'etiti olùlù n'ubọchi snow nēzò.23. Onye ahu tib͕u-kwa-ra nwoke ahu, bú onye Ijipt, nwoke toro ogologo, cubit ise; ube di kwa n'aka onye Ijipt ahu dika oké ókpòrò di arọ́ nke ọkpa-ákwà ji akpa ákwà; ma o ji nkpa-n'aka ridakuru ya, napu ube ahu n'aka onye Ijipt n'ike, were ube-ya b͕ue ya.24. Ihe ndia ka Benaia nwa Jehoiada mere, we nwe aha n'etiti ndi-dike atọ ahu.25. Le, anāsọpuru ya kari orú ndikom na iri ahu, ma o rughi ndikom atọ mbu ahu: Devid we do ya onye-isi ndi nānu okwu-ya.26. Ndi-dike nke usu nile nke ndi-agha kwa; Asahel nwa-nne Joab, Elhanan nwa Dodo nke Bet-lehem;27. Shamot onye Haroa, Hilez onye-Pelonait;28. Ira nwa Ikesh onye Tekoa, Abieza onye Anatot;29. Sibekai onye Husha, Ilai onye Ahoa;30. Maharai onye Netofa, Hiled nwa Beana onye Netofa;31. Itai nwa Ribai nke Gibea umu Benjamin, Benaia onye Piraton;32. Hurai nke miri-iyi Gaash, Abiel onye Araba;33. Azmavet onye Bahurim, Eliahba onye Shaalabin;34. nke umu Hashem onye-Gaizonait, Jonatan nwa Shagei onye-Hararait;35. Ahiam nwa Saka onye-Hararait, Elifal nwa Ua;36. Hefa onye-Mekeratait, Ahaija onye-Pelonait;37. Hezro onye Kamel, Naarai nwa Ezbai;38. Joel nwa-nne Netan, Mibha nwa Hagri;39. Zelek onye Amon, Naharai onye Beirot, onye nēbu ihe-agha Joab nwa Zeruaia;40. Ira onye Jeta, Gareb onye Jeta;41. Uraia onye Het, Zabad nwa Ahlai;42. Adina nwa Shiza onye Reuben, onye-isi ndi Reuben, orú ndikom na iri so-kwa-ra ya;43. Henan nwa Meaka, na Joshafat onye-Mitnait;44. Uzia onye Ashterot, Shama na Jeiel, bú umu Hotam onye Aroea;45. Jediael nwa Shimri, na Joha nwa-nne-ya, onye-Tizait;46. Eliel onye-Mahavait, na Jeribai, na Joshavia, umu Elnaam, na Itma onye Moab;1 IHE EMERE 12:1-401. Ma ndia bu ndi nābiakute Devid rue Ziklag, mb͕e anọ̀ nēmechibido ya n'ihi Sọl nwa Kish: ndi ahu di kwa n'etiti ndi-dike-ya, ndi nēyere ya aka n'agha ahu.2. Ha nāchi uta, nēme aka-nri nēme kwa aka-ekpe n'itu nkume na n'iwere uta b͕a àkú; ha sitere n'umu-nne Sọl site na Benjamin.3. Onye-isi bu Ahieza, na Joash, bú umu Shemaa onye Gibea; na Jeziel, na Pelet, bú umu Azmavet; na Beraka, na Jihu onye Anatot;4. na Ishmaia onye Gibeon, bú dike n'etiti orú ndikom na iri ahu, na onye-isi orú na iri ahu; na Jeremaia, na Jahaziel, na Johanan, na Jozabad onye Gedira;5. Eluzai, na Jerimot, na Bealia, na Shemaraia, na Shefataia onye-Harufait;6. Elkena, na Ishia, na Azarel, na Joeza, na Jashọbeam, bú ndi Kora;7. na Joela, na Zebadaia, bú umu Jeroham nke Gedoa.8. Ufọdu nime ndi Gad kewaputa-kwa-ra onwe-ha jekuru Devid rue ebe ahu ewusiri ike n'ọzara, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom usu-ndi-agha ibu agha, ndi nēdo ọta na ube n'usoro; iru-ha bu kwa iru ọdum, ha di kwa ngwa dika mb͕ada n'elu ugwu;9. Iza, bú onye-isi, Obadaia, bú nke-abua, Elaiab, bú nke-atọ;10. Mishmana, bú nke-ano, Jeremaia, bú nke-ise;11. Atai, bú nke-isi, Eliel, bú nke-asa;12. Johanan, bú nke-asatọ, Elzabad, bú nke-iteghete;13. Jeremaia, bú nke-iri, Makbanai, bú nke-iri-na-otù.14. Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri.15. Ndia bu ndikom ahu ndi gabigara Jọdan n'ọnwa mbu, mb͕e osimiri ahu nēruchi usọ-ya nile; ha we me ka ndi ndagwurugwu nile b͕alaga, ma n'Ọwuwa-anyanwu ma n'Ọdida-anyanwu.16. Ufọdu nime umu Benjamin na Juda we biarue ebe ahu ewusiri ike biakute Devid.17. Devid we pua izute ha, o we za, si ha, Ọ buru na unu abiakutem n'uzọ udo iyerem aka, enwerem obi ọma n'aru unu ka mu na unu buru otù: ma ọ buru na unu abiawo iwere aghughọ nyem n'aka ndi nākpab͕um, mb͕e ihe-ike nādighi n'akam, ka Chineke nna-ayi-hà hu ya, bara unu nba.18. Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.19. Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl.20. Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase.21. Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha.22. N'ihi na mb͕e ahu ha nābiakute Devid kwa-ubọchi iyere ya aka, rue mb͕e ọ bu ọmuma-ulo-ikwū, dika ọmuma-ulo-ikwū Chineke.23. Ndia bu kwa ọnu-ọgugu ndi-isi nke ndi ejikere iso usu-ndi-agha; ha biakutere Devid nime Hebron ichighari ala-eze Sọl nye ya, dika okwu-ọnu Jehova si di.24. Umu Juda ndi nēbu ọta na ube di nnù iri-na-asa, ndi ejikere iso usu-ndi-agha.25. Site n'umu Simeon, ndi-dike bu dìnkpà iso usu-ndi-agha, nnù iri-na-asa na ọgu iri-na-ise.26. Site n'umu Livai, nnù iri-na-otù na ọgu iri.27. Jehoiada bu onye-ndú ndi Eron, nnù ndikom iteghete na ọgu ise so-kwa-ra ya;28. na Zedok, bú nwa-okorọbia nke bu dike bu dìnkpà, na nke ulo nna-ya orú ndi-isi na abua.29. Site kwa n'umu Benjamin, bú umu-nne Sọl, nnù asa na ọgu iri: n'ihi na rue mb͕e ahu ndi ka n'ọnu-ọgugu nime ha nēdebe ihe-ndebe ulo Sọl.30. Site kwa n'umu Efraim, orú nnù uzọ abua na nnù iri-na-abua, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha n'ulo nke ndi bu nna-ha.31. Site kwa na nkera ebo Manase, orú nnù uzọ abua na nnù ise, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ibia ime Devid eze.32. Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.33. Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n'usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n'usoro, nēnweghi obi abua.34. Site kwa na Naftali, nnù ndi-isi abua na ọgu iri, orú nnù ndikom uzọ anọ na nnù iri-na-abua na ọgu iri so-kwa-ra ha nāchi uta na ube.35. Site kwa na ndi Dan, bú ndi nēdo agha n'usoro, orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-otù na ọgu iri.36. Site kwa n'Asha, bú ndi nāpukuru usu-ndi-agha ido agha n'usoro, orú nnù uzọ ise.37. Site kwa n'ofè Jọdan, site n'umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, bú ndi nāchi ihe nile nke usu-ndi-agha iji bu agha, orú nnù uzọ iri-na-ise.38. Ndia nile, bú ndikom agha, ndi nēdo agha n'usoro, were obi zuru okè biarue Hebron, ime Devid eze Israel nile: ọzọ kwa, ndi Israel nile nke fọduru nwere otù obi ime Devid eze.39. Ha na Devid we nọ n'ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n'ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe.40. Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.ABÙ ỌMA 77:16-2016. Miri huru Gi, Chineke; Miri huru Gi, o nēb͕u ha nb͕u: Ọzọ, ob͕u-miri nile mara jijiji.17. Igwe-oji nile wupuru miri; Mbara-ígwé mere ka olu-ha da udà: Ọzọ, àkú-gi nile nēfeghari.18. Olu nke éb͕è-elu-igwe-Gi di n'ifufe nēfeghari buruburu; Àmùmà nyere elu-uwa dum madu bi ìhè: Ala mere nkpatu ma kwa jijiji.19. N'oké osimiri ka uzọ-Gi di, Uzọ-ije-Gi nile di kwa n'ọtutu miri, Amaghi kwa nzọ-ukwu-Gi nile.20. I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.ILU 19:17-1917. Onye nēbinye Jehova ihe ka onye nēmere onye nēnweghi ike amara bu, Ọ bu kwa nmeso ọma ya ka Ọ gākwughachi ya.18. Dọ nwa-gi aka na nti, n'ihi na olile-anya di; Atukwasi-kwa-la obi-gi n'ime ka ọ nwua.19. Onye oké ọnuma ganāra nra: N'ihi na ọ buru na i naputa ya, i gēme kwa ya ọzọ.ỌLU OZI 7:1-211. Onye-isi-nchu-àjà we si, Ìhe ndia di otú a?2. O we si, Umu-nnam na ndi bu nnam, nurunu. Chineke nke ebube mere ka nna-ayi Abraham hu Ya anya, mb͕e ọ nọ na Mesọpọtemia, mb͕e ọ kēbighi na Heran,3. O we si ya, Si n'ala-gi na n'etiti ikwu-gi pua, bia n'ala ahu nke M'gēgosi gi.4. Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a:5. ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.6. Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n'ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ.7. Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a.8. O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.9. Nna uku ahu, ebe ha nēkwo Josef ekworo, ha we re ya ga n'Ijipt: ma Chineke nọyere ya,10. weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum.11. Oké unwu we dikwasi Ijipt na Kenean dum, ya na oké nkpab͕u: nna-ayi-hà ahughi ihe gēju ha afọ.12. Ma mb͕e Jekob nuru na ọka di n'Ijipt, o we zipu nna-ayi-hà na mbu.13. Na nke mere ya ub͕ò abua ewe me ka umu-nne Josef mara Josef; ewe me ka ndi-aru Josef puta ìhè nye Fero.14. Josef we ziga, kpọ Jekob, bú nna-ya, na ikwu-ya nile, ka ha biakute ya, ọgu madu atọ na iri na ise.15. Jekob we ridata n'Ijipt; o we nwua, ya onwe-ya, na nna-ayi-hà;16. ewe būru ha gabiga n'ofè rue Shekem, tọb͕ọ ha n'ílì ahu nke Abraham were ọnu-ahia n'ọla-ọcha go n'aka umu Hemoa nime Shekem.17. Ma mb͕e oge nkwa ahu nēru nso, nke Chineke kwere Abraham, ndi-Ju gara n'iru ba kwa uba n'Ijipt,18. rue mb͕e eze di iche biliri ibu eze Ijipt, onye nāmataghi Josef.19. Onye ahu were aghughọ meso ndi-aru-ayi, me kwa nna-ayi-hà ihe ọjọ, ka ha we tufue umu ọhu ha ka aghara ime ka ha di ndu.20. N'oge ahu ka amuru Moses, o we ma nma nke-uku; ewe zùa ya ọnwa atọ n'ulo-ya:21. ma mb͕e etufuru ya, nwa-nwanyi Fero paliri ya, zùa ya ka ọ buru nwa ya onwe-ya nwere. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006