Bible n'ime otu afọ Julaị 182 IHE EMERE 32:1-331. Mb͕e ihe ndia na ezi-okwu a gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, biara, ba nime Juda, we ma ulo-ikwū-ya imegide obodo nile ewusiri ike, si na o gētipú ha nye onwe-ya.2. Hezekaia we hu na Senakerib abiawo, che iru ibuso Jerusalem agha,3. o we me ndi-isi-ya na ndi-dike-ya ka ha dua ya ọdu, ib͕ochi miri nke isi-iyi nile nke di n'azu obodo; ha we yere ya aka.4. Ewe chikọta ndi di ọtutu, ha we b͕ochie isi-iyi nile, na miri-iyi ahu nke nērùsi ike n'etiti ala-ha, si, N'ìhi gini ka ndi-eze Asiria gābia, hu ọtutu miri?5. O we me onwe-ya ka ọ di ike, we wuzie mb͕idi nile nke etipúru etipú, o we wulie ya rue ulo-elu-ya nile, wu kwa mb͕idi ọzọ n'azu, me ka Milo, nke di n'obodo Devid, di ike, o me-kwa-ra ihe-agha na ọta n'uba.6. O we do ndi-ọchi-agha ka ha buru ndi-isi ndi-ya, o we chikọta ha n'ebe ọ nọ n'amá nke ọnu-uzọ-ama obodo, gwa ha okwu nābà n'obi-ha, si,7. Dinu ike nwe kwa ume, unu atula egwu atu-kwa-la ujọ n'ihi eze Asiria, ma-ọbu n'ihi ìgwè ahu nile nke nọyere ya: n'ihi na nke nọyere ayi di ọtutu kari nke nọyere ya:8. nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.9. Mb͕e nka gasiri, Senakerib, bú eze Asiria, zigara ndi-orù-ya na Jerusalem, (ma ya onwe-ya nānọchigide Lekish n'agha, ya na ndi nile ọ nāchi,) jekuru Hezekaia, bú eze Juda, jekuru kwa Juda nile ndi nọ na Jerusalem, si,10. Otú a ka Senakerib, bú eze Asiria, siri, N'ìhe gini ka unu onwe-unu nātukwasi obi, unu we nānọdu n'ebe ewusiri ike, bú nime Jerusalem?11. Hezekaia, ọ̀ dighi-akpali unu, ira unu nye ka unu nwua site n'oké unwu, site kwa n'akpiri-ikpọ-nku, si, Jehova, bú Chineke-ayi, gānaputa ayi n'ọbu-aka eze Asiria?12. Ọ̀ bughi Hezekaia ahu wezugara ebe-Ya nile di elu na ebe-ichu-àjà-Ya nile, gwa Juda, gwa kwa Jerusalem, si, Ọ bu n'iru otù ebe-ichu-àjà ka unu gākpọ isi ala, ọ bu kwa n'elu ya ka unu gēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ?13. Ùnu amaghi ihe m'mere ndi nile nke ala ọzọ nile, mu onwem na nnam-hà? chi mba nile nke ala ọzọ nile, hà puru inaputa ala-ha n'akam ma-ọli?14. Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam?15. Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.16. Ndi-orù-ya kwu-kwa-ra okwu ọzọ imegide Jehova, bú Chineke, na imegide orù-Ya, bú Hezekaia.17. Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.18. Ha we were oké olu kpọ ndi Jerusalem ndi nọ n'elu mb͕idi òkù n'asusu ndi-Ju, ime ka ha tua egwu, na ime ka ha ma jijiji; ka ha we were obodo-ha.19. Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.20. Hezekaia, bú eze, na Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, we kpe ekpere bayere ihe a, we tikue elu-igwe.21. Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu.22. Jehova we zọputa Hezekaia na ndi bi na Jerusalem n'aka Senakerib, bú eze Asiria, na n'aka madu nile, we nēdu ha buruburu.23. Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.24. Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria rue inwu: o we kpere Jehova; O we gwa ya okwu, nye ya ihe-ebube.25. Ma ọ bughi dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n'ihi na obi-ya di elu: iwe we dikwasi ya, dikwasi kwa Juda na Jerusalem.26. Hezekaia we ruru ala n'ihi idi-elu nke obi-ya, ya onwe-ya na ndi bi na Jerusalem, iwe Jehova abiakwasighi kwa ha n'ubọchi Hezekaia.27. Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;28. o me-kwa-ra ulo nchikọbata-ihe idebe omume ọka na manya-vine ọhu na manu; na ulo anu nile ọ bula di iche iche, na ìgwè aturu n'ulo-anu.29. O we mere onwe-ya obodo di iche iche, na ihe-nnweta, bú ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, n'uba: n'ihi na Chineke nyere ya àkù bara uba nke-uku.30. Hezekaia nka b͕ochi-kwa-ra isi-iyi miri Gaihon di n'elu, we me ka miri ahu rùdazie n'akuku Ọdida-anyanwu obodo Devid. Ihe nāga-kwa-ra Hezekaia nke-ọma n'ọlu-ya nile.31. Otú ọ di, n'okwu ndi-ukọ nke ndi-isi Babilon, ndi zitere ya ozi iju ajuju bayere ihe-ebude nke mere n'ala, Chineke rapuru ya inwa ya, ka O we mara ihe nile di n'obi-ya.32. Ma ihe nile Hezekaia mere nke fọduru, na ọlu-ebere-ya nile, le, edewo ha n'ọhù Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.33. Hezekaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya n'ebe-nrigo nke ílì umu Devid. Juda nile na ndi bi na Jerusalem we mere ya ihe-nsọpuru n'ọnwu-ya. Manase nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.2 IHE EMERE 33:1-251. Manase b͕ara arọ iri na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na iri na ise nime Jerusalem.2. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe-árú nile nke mba ọzọ si di, bú ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.3. Ebe di elu nke Hezekaia nna-ya kwaturu, o wue ha ọzọ; o guzo-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye Bealim, me kwa Asherot, kpọ kwa isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè ha òfùfè.4. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà di iche iche n'ulo Jehova, nke Jehova siri, Nime Jerusalem ka aham gādi rue mb͕e ebighi-ebi.5. O wu-kwa-ra ebe-ichu-àjà nye usu nile nke ihe elu-igwe n'ogige abua nke ulo Jehova.6. Onye ahu me-kwa-ra ka umu-ya ndikom gabiga nime ọku nime ndagwurugwu nwa Hinom: o ji-kwa-ra igwe-oji tu isi ọma na isi ọjọ, ọ b͕a-kwa-ra afa, me ihe-mb͕asi, meso onye nāju mọ ihe na ndi-dibia-afa: o mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova ri nne, ikpasu Ya iwe.7. Ọ dọba-kwa-ra arusi apiri api nke oyiyi-ihe ahu, bú nke o mere, n'ulo Chineke, bú nke Chineke siri Devid, si kwa Solomon nwa-ya, Ṅ'ulo a, na nime Jerusalem, nke M'rọputaworo n'ebo nile nke Israel, ka M'gētiye aham rue mb͕e ebighi-ebi:8. M'gaghi-esi kwa n'elu ala nke M'guzoro nye nna-unu-hà wezuga ukwu Israel ọzọ: nání ọ buru na ha elezi anya ime nile nke M'nyeworo ha n'iwu, bú iwu ahu nile na ukpuru nile na ikpé nile nke sitere n'aka Moses.9. Manase we me ka Juda na ndi bi na Jerusalem sihie uzọ, ime ihe ọjọ kari mba ọzọ, bú ndi Jehova kpochapuru n'iru umu Israel.10. Jehova we gwa Manase okwu, gwa kwa ndi-ya: ma ha aṅaghi nti.11. Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon.12. Ma mbe anākpab͕u ya, ọ chọ ka iru Jehova, bú Chineke-ya, dajua, we ruru ala nke-uku n'iru Chineke nke nna-ya-hà.13. O we kpere Ya; O we kwe ka ọ riọta ihe ọ riọrọ, we nuru aririọ-amara-ya, me ka ọ lata na Jerusalem ba n'ala-eze-ya. Manase we mara na Jehova, Ya onwe-ya, bu Chineke.14. Mb͕e ihe ndia gasiri, o wuere obodo Devid mb͕idi n'azu mb͕idi-ya, n'akuku Ọdida-anyanwu nke Gaihon, nime ndagwurugwu, we rue nbata n'ọnu-uzọ-ama azù; ọ b͕a kwa Ofel buruburu, me ka ọ di elu nke-uku: o do-kwa-ra ndi-isi usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nime Juda.15. O wezuga-kwa-ra chi nile nke ala ọzọ, si kwa n'ulo Jehova wezuga oyiyi-ihe ahu, ya na ebe-ichu-àjà nile nke o wuru n'ugwu ulo Jehova, na nime Jerusalem, o kpofue ha n'azu obodo.16. O wue ebe-ichu-àjà Jehova, chua n'elu ya àjà, bú àjà-udo na àjà-ekele, ọ si Juda ka ha fè Jehova, bú Chineke Israel, òfùfè.17. Otú ọ di, ndi Juda nọ nāchu àjà n'ebe di elu nile, ma ọ bu nání nye Jehova, bú Chineke-ha.18. Ma ihe nile Manase mere nke fọduru, na ekpere-ya o kpere Chineke-ya, na okwu nile nke ndi-ọhu-uzọ, bú ndi gwara ya okwu n'aha Jehova, bú Chineke Israel, le, edewo ha n'akwukwọ ihe ndi-eze Israel mere.19. Ekpere-ya kwa, na otú ekwere ka ọ riọta ìhe, na nmehie-ya nile, na nmekpu-ya, na ebe nile nke o wuru ebe di elu nime ha, guzo kwa Asherim na arusi apiri api, tutu o ruru ala: le, edewo ha n'akwukwọ okwu Hozai.20. Manase we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ha we lìe ya, n'ulo-ya: Emon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.21. Emon b͕ara orú arọ na abua mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze arọ abua nime Jerusalem.22. O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika Manase, bú nna-ya, mere: Emon we chuara arusi nile apiri api, bú nke Manase nna-ya mere, àjà, we fè ha òfùfè.23. Ma o rurughi ala n'iru Jehova, dika Manase, bú nna-ya, ruru ala; kama Emon nka mere ka ikpe ma ya ri nne.24. Ndi-orù-ya we kekọta onwe-ha imegide ya, ha we me ka ọ nwua n'ulo-ya.25. Ndi ala ahu we tib͕ue ndi nile nēkekọta onwe-ha imegide eze, bú Emon: ndi ala ahu we me Josaia nwa-ya eze n'ọnọdu ya.ABÙ ỌMA 85:8-138. M'gānu ihe Chineke, bú Jehova, gēkwu: N'ihi na Ọ gāgwa ndi-Ya, gwa kwa ndi-ebere-Ya, okwu udo: Ma ka ha ghara ilaghachi ba n'ihe-nzuzu.9. Otú ọ di, nzọputa-Ya di nso ndi nātu egwu Ya; Ka nsọpuru we biri n'ala-ayi.10. Ebere na ezi-okwu ezutewo; Ezi omume na udo esutuwo ọnu.11. Ezi-okwu nēpú epú n'ala; Ezi omume esiwo kwa n'elu-igwe lepu anya.12. Ọzọ, Jehova gēnye ezi ihe; Ala-ayi gēnye kwa ihe-ọmume-ya.13. Ezi omume gāga n'iru Ya; Ọ gēme kwa ka nzọ-ukwu-Ya nile ghọ uzọ.ILU 21:12-1212. Onye ezi omume nēnwe uche n'imeso ulo nke onye nēmebi iwu; Ọ nēkpù ndi nēmebi iwu iru n'ihi ihe ọjọ ha.ỌLU OZI 20:17-3817. O we si na Militọs ziga n'Efesọs, kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya.18. Mb͕e ha biakutere ya, ọ si ha, Unu onwe-unu mara, site n'ubọchi mbu m'zọrọ ukwu n'Esia, otú m'nọ n'etiti unu oge ahu nile,19. otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:20. otú egwu nēmeghm ka m'ghara ikọrọ unu otù ihe n'ihe nile bara unu urù, na izí unu ihe n'iru ọra madu, n'ulo nke aka unu kwa n'otù n'otù,21. nāgwasi unu ike, ma ndi-Ju ma ndi-Grik, okwu nchèghari n'ebe Chineke nọ, na okwukwe n'ebe Onye-nwe-ayi Jisus nọ.22. Ma ub͕u a, le, mu onwem nāga Jerusalem n'ab͕u nime mọ nkem, nāmataghi ihe ọ bula gābiakwasim n'ebe ahu:23. ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n'obodo nile n'otù n'otù, nāsi na ab͕u na nkpab͕u nādigide nēchem.24. Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.25. Ma ub͕u a, le, mu onwem matara na unu onwe-unu nile, ndi m'jeghariri n'etiti unu nēkwusa ala-eze Chineke, na unu agaghi-ahu irum ọzọ.26. N'ihi ya agwasim unu ike ubọchi ta, na adim ọcha n'ebe ọbara madu nile di.27. N'ihi na egwu emeghm ka m'ghara ikọrọ unu ìzù nile nke Chineke.28. Nēzenu onwe-unu na ìgwè aturu ntà nile, nke Mọ Nsọ mere unu ndi nēlekota ya anya n'etiti ya, ka unu nāzù nzukọ Chineke dika aturu, nke O ji ọbara nke Ya onwe-ya zutara Onwe-ya.29. Mu onwem matara na mb͕e m'lasiri agu jọb͕uru onwe-ha gābà n'etiti unu, ghara imere ìgwè aturu ebere;30. ndikom gēsite kwa n'etiti unu onwe-unu bilie, nēkwu ihe di iche iche nēduhie madu uzọ, ka ha dọpu ndi nēso uzọ Jisus iso ha n'azu.31. N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie.32. Ub͕u a ararakwam unu nye n'aka Chineke na aka okwu amara-Ya, nke puru iwuli unu elu dika ulo, na inye unu ihe-nketa ahu n'etiti ndi nile edoworo nsọ.33. Agu ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo ma-ọbu uwe nke onye ọ bula agughm.34. Unu onwe-unu mara na akam ndia nālutara mu onwem na ndi mu na ha nọ ihe nākpà mu na ha.35. N'ihe nile egosirim unu, na unu aghaghi idọb͕u onwe-unu n'ọlu otú a, na iyere ndi nādighi ike aka, na icheta okwu Onye-nwe-ayi Jisus, na Ya onwe-ya siri, Ọ di ngọzi inye ihe kari inara ihe.36. Mb͕e o kwusiri ihe ndia, o b͕ue ikperè n'ala, ya na ha nile kpere Chineke.37. Ha nile we kwa ákwá nke-uku, dakwasi Pọl n'olu, sutu kwa ya ọnu,38. ihe nēb͕u ha nb͕u kari ihe nile bu okwu nke o kwururi, na ha agaghi-ahu iru-ya ọzọ. Ha we dupu ya n'ije-ya rue mb͕e ọ batara n'ub͕ọ. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006