Bible n'ime otu afọ Julaị 23EZRA 7:1-281. Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia,2. nwa Shalum, nwa Zedok, nwa Ahaitub,3. nwa Amaraia, nwa Azaraia, nwa Meraiot,4. nwa Zerahia, nwa Uzi, nwa Buki,5. nwa Abishua, nwa Finehas, nwa Eleeza, nwa Eron, bú onye-isi-nchu-àjà:6. Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.7. Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.8. O we biarue Jerusalem n'ọnwa nke-ise, nke ahu di n'arọ nke-asa nke eze.9. N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya.10. N'ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n'Israel.11. Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel.12. Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.13. Esitewo n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n'ala-ezem, ya so gi je.14. N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem;15. na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem,16. na ọla-ọcha na ọla-edo nile nke i gāchọta n'ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, tiyere onyinye-afọ-ofufo nke ndi-gi, na nke ndi-nchu-àjà-ha, ndi nēwere afọ-ofufo nye onwe-ha bayere ulo Chineke-ha nke di na Jerusalem;17. n'ihi nka i gēme ngwa were ego a zuru oke-ehi na ebulu na umu-aturu, na onyinye-inata-iru-ọma-ha na àjà-ihe-ọṅuṅu-ha, i gēweta ha nso ebe-ichu-àjà nke ulo Chineke-unu nke di na Jerusalem.18. Ma ihe ọ bula nke gādi gi nma, di kwa umu-nne-gi nma, iwere nke fọduru nime ọla-ọcha na ọla-edo ahu me, dika ọchichọ Chineke-unu si di ka unu gēme.19. Ihe nile kwa nke anēnye gi iji fè òfùfè nke ulo Chineke-gi, gi me ha ka ha zue okè n'iru Chineke Jerusalem.20. Ma nke fọduru n'ihe nile di nkpà nke ulo Chineke-gi, nke gādabayere gi inye, si n'ulo àkù eze nye ya.21. Anēsite kwa n'akam, bú mu onwem, Ataksakses, bú eze, nye ndi-odozi-àkù nile ndi nọ n'ofè osimiri iwu, na ihe ọ bula Ezra, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, gāriọ unu, ka eme ya ngwa ngwa,22. rue ọgu talent ọla-ọcha ise, ru kwa ọgu cor ọka wheat ise, ru kwa ọgu bath manya-vine ise, ru kwa ọgu bath manu ise, na nnú nke anēdeghi akwukwọ ọtùtù-ya.23. Ihe ọ bula nke putara n'iwu Chineke nke elu-igwe, ka eme ya n'uzọ ziri ezi nye ulo Chineke nke elu-igwe; n'ihi na, n'ìhi gini ka iwe gādi megide ala-eze nke eze na umu-ya ndikom?24. Ayi nēme kwa ka unu mara, na ọ dighi onye ka enyere ike n'aru ndi-nchu-àjà na ndi Livai ọ bula, ma-ọbu ndi nābù abù ọma, ma-ọbu ndi-ọnu-uzọ-ama, ma-ọbu Netinim, ma-ọbu ndi nēfè òfùfè nke ulo a nke Chineke, inara ha utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ.25. Ma gi onwe-gi, Ezra, dika amam-ihe nke Chineke-gi nke di n'aka-gi si di, guputa ndi-ikpe na ndi-odozi-okwu, ndi gāburu ndi nile nọ n'ofè osimiri, bú ndi nile mara iwu Chineke-gi, ndi-odozi-okwu; me-kwa-nu ka ọ mara iwu ahu, bú onye nāmaghi.26. Ma onye nke nēmeghi iwu Chineke-gi, na iwu eze, ka ewere ngwa ngwa me ya ihe ekpere n'ikpe, ma ọ bu inwu ọnwu, ma-ọbu iwepu ya n'ala, ma-ọbu iri àkù-ya na nra, ma-ọbu ike ya ab͕u.27. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, bu, Onye tiyeworo ihe di otú a n'obi eze, nime ka ulo Jehova nke di na Jerusalem ma nma;28. Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n'ebe m'nọ n'iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n'iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M'we me onwem ka m'di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n'arum, m'we chikọputa n'Israel ndi-isi isorom rigo.EZRA 8:1-361. Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n'ọbubu-eze Ataksakses, bú eze.2. Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush.3. Site n'umu Shekania; site n'umu Parosh, Zekaraia: ndi soro ya, bú ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu diri ndikom, di ọgu asa na iri.4. Site n'umu Pahat-moab, Eliehoenai nwa Zerahai; ndi soro ya di ọgu ndikom iri.5. Site n'umu Shekania, nwa Jahaziel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri-na-ise.6. Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.7. Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.8. Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.9. Site n'umu Joab, Obadaia nwa Jehiel; ndi soro ya di ọgu ndikom iri na iri na asatọ.10. Site kwa n'umu Shelomit, nwa Josifia; ndi soro ya di ọgu ndikom asatọ.11. Site kwa n'umu Bebai, Zekaraia nwa Bebai; ndi soro ya di orú ndikom na asatọ.12. Site kwa n'umu Azgad, Johanan nwa Hakatan; ndi soro ya di ọgu ndikom ise na iri.13. Site kwa n'umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ.14. Site kwa n'umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.15. M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu.16. M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.17. M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.18. Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n'aru ayi, o sitere n'umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;19. na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n'umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu;20. site kwa na Netinim, ndi Devid na ndi-isi nyere ka ha fè òfùfè nke ndi Livai, ọgu Netinim iri-na-otù: ha nile ka akpọrọ n'aha n'aha.21. M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.22. N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.23. Ayi we bue ọnu, riọ Chineke-ayi aririọ bayere nka: O we kwe ka ayi riọta ihe ayi riọrọ.24. M'we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n'umu-nne-ha,25. m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri:26. m'we tùa nye ha n'aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;27. na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.28. M'we si ha, Unu onwe-unu bu ihe nsọ Jehova nwere, ihe ndia bu kwa ihe nsọ; ọla-ọcha na ọla-edo bu kwa onyinye-afọ-ofufo enyere Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà.29. Nechenu ha nche, debe kwa ha, rue mb͕e unu tùru ha n'iru ndi-isi nke ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel, nime Jerusalem, n'ime-ulo nke ulo Jehova.30. Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.31. Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.32. Ayi we biarue Jerusalem, nọdu n'ebe ahu ubọchi atọ.33. Ma n'ubọchi nke-anọ ka atùru ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile n'ulo Chineke-ayi nye n'aka Meremot, nwa Uraia, bú onye-nchu-àjà; Eleeza nwa Finehas nọye-kwa-ra ya; Jozabad nwa Jeshua na Noadaia nwa Binui, bú ndi Livai, nọye-kwa-ra ha;34. n'ọnu-ọgugu na n'ọtùtù ka enyere ha ihe ọ bula: ewe de ọtùtù nile n'akwukwọ na mb͕e ahu.35. Ndi nēsi na ndọta-n'agha bia, bú umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, wetara àjà-nsure-ọku nso Chineke Israel, oke-ehi iri na abua n'ihi Israel nile ọgu ebulu anọ na iri na isi, ọgu umu-aturu atọ na iri na asa, nkpi iri na abua ibu àjà-nmehie: ihe a nile bu àjà-nsure-ọku isurere Jehova.36. Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n'ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.ABÙ ỌMA 88:1-51. Jehova, Chineke nke nzọputam, N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:2. Kwe ka ekperem bata n'iru Gi; Tọ nti-Gi n'ala n'iti-nkpum:3. N'ihi na afọ ihe ọjọ di iche iche ejuwo nkpuru-obim, Ndum abiaruwo kwa nso ala-mọ.4. Aguwom na ndi nārida n'olùlù; Aghọwom onye di ka nwoke nēnweghi ike:5. Anọm n'etiti ndi nwuru anwu, buru onye nwere onwe-ya, Dika ndi eb͕uru eb͕u ndi nēdina n'ílì, Ndi I nēchetaghi ọzọ; Ndi ahu bu kwa ndi ebipuworo n'aka-Gi.ILU 21:21-2221. Onye nāb͕aso ezi omume na ebere Nāchọta ndu, na ezi omume, na nsọpuru.22. Obodo ndi-dike ka onye nke mara ihe rigobàworo, O we me ka ike nke ikwesi-ntukwasi-obi-ya rida.ỌLU OZI 23:16-3516. Ma nwa nke nwa-nne-nwanyi Pọl nuru na ha nēche inwude ya, o we bia ba n'ulo ndi-agha ahu, kọrọ Pọl.17. Pọl we kpọtara onwe-ya otù onye nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Duru nwa-okorọbia nka jekuru onye-isi-ọchi-agha: n'ihi na o nwere ihe ikọrọ ya.18. Ya mere o kuru ya, duru ya jekuru onye-isi-ọchi-agha, si, Pọl onye-nkpọrọ kpọrọm jekuru ya, we kperem ka m'dutara gi okorọbia nka, ebe ọ nwere okwu igwa gi.19. Onye-isi-ọchi-agha we jide ya n'aka, wezuga onwe-ya we jua ya iche, si Gini bu ihe i nwere ikọrọm?20. Ọ si, Ndi-Ju kwekọrọ ọnu ikpere gi ka i kuda Pọl echi jekuru nnọkọ-ikpé-ha, dika i gaje ijuta ihe bayere ya nke-ọma kari.21. Ya mere, gi onwe-gi ekweyela ha: n'ihi na ndikom kariri ọgu madu abua n'etiti ha nēche inwude ya, ndi mere onwe-ha ka ha buru anathema, si na ha agaghi-eri ihe ma-ọbu iṅu ihe rue mb͕e ha gēb͕uwori ya: ub͕u a ha edoziwo kwa onwe-ha, nēche nkwa i gēkwe ha.22. Ya mere onye-isi-ọchi-agha zilagara nwa-okorọbia ahu, nēnye ya iwu, si, Agwala onye ọ bula na i gosirim ihe ndia.23. O we kpọtara onwe-ya madu abua nime ndi-ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, si, Dozienu ọgu ndi-agha iri ka ha ga rue Sisaria, na ọgu ndi-inyinya atọ na iri, na ọgu ndi-agha iri nāchi ube, n'oge hour nke-atọ n'abali:24. ọ gwa-kwa-ra ha ka ha chita anu-ulo, ka ha we dọkwasi Pọl n'elu ha, debe kwa ya nke-ọma rue mb͕e ha gābiakute Filiks, bú onye-isi.25. O we de akwukwọ-ozi nke yiri nka:26. Klọdiọs Lisias nēdegara Filiks, bú onye-isi di oké ebube, akwukwọ, nēkele ya.27. Ndi-Ju jidere nwoke a, ha gaje kwa ib͕u ya, mb͕e mu na ndi-agha biakwasiri ha, weputa ya n'aka-ha, ebe m'nutasiri na ọ bu onye Rom.28. Ebe m'zubere imazu ihe mere ha ji bo ya ebubo, m'we kudata ya na nnọkọ-ikpé-ha:29. onye m'huru na anēbo ya ebubo bayere ajuju di iche iche nke iwu-ha, ma o nweghi ihe eboro ya kwesiri ọnwu ma-ọbu ab͕u.30. Ma mb͕e egosirim na agāb͕a ajọ ìzù megide nwoke a, ngwa ngwa m'we zitere gi ya, nye kwa ndi nēbo ya iwu ka ha kwugide ya okwu n'iru gi.31. Ya mere ndi-agha, dika akara ha àkà, were Pọl, kuru ya rue Antipatris n'abali.32. Ma n'echi-ya ha rapuru ndi-inyinya ka ha so ya je, ha we laghachi n'ulo ndi-agha:33. mb͕e ndi ahu biaruru Sisaria, nye kwa onye-isi akwukwọ-ozi ahu, ha we che kwa Pọl n'iru ya.34. Mb͕e ọ gusiri ya, ọ jua ajuju ala o si puta; mb͕e ọ jutara na ọ bu onye Silisia,35. ọ si, M'gānuzu okwu-gi mb͕e ọ bula ndi boro gi ebubo gēru kwa ebe a: o we nye iwu ka edebe ya na Pritoriọm nke Herod. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006