Nsụgharị Bible Tụlee

1
Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya.
2
Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.”
3
Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.”
Igbo Bible 2020
Igbo Contemporary Bible™ 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc
1
O we ba nime ub͕ọ, gabiga n'ofè ọzọ, bia n'obodo nke aka Ya.
2
Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile.
3
Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke.
Igbo Bible 2006
Igbo Bible Society of Nigeria 1906, 2006
1
Jisọs banyekwara nꞌụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo na Kapanọm.
2
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”
3
Ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulukwanụ Chineke.”
Igbo Bible 1988
No Data