Nsụgharị Bible Tụlee
- |
|---|
| 1 |
| Jisọs banyekwara nʼụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo nʼobodo nke ya. |
| 2 |
| Ndị ikom ụfọdụ butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, bụ onye dina nʼute. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe ndị ahụ, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nwa m nwoke nʼihi na a gbagharala gị mmehie gị niile.” |
| 3 |
| Nʼoge a, ụfọdụ ndị ozizi iwu nke ndị Juu nọ nʼebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulu Chineke.” |
| Igbo Bible 2020
Igbo Contemporary Bible™ 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc |
| 1 |
| O we ba nime ub͕ọ, gabiga n'ofè ọzọ, bia n'obodo nke aka Ya. |
| 2 |
| Ma le, ha butere Ya onye akuku-aru-ya nwuru anwu, tọb͕ọrọ n'ihe-ndina: mb͕e Jisus huru okwukwe-ha Ọ si onye ahu akuku-aru-ya nwuru anwu, Nwa, nwe obi-ike; anāb͕aghara gi nmehie-gi nile. |
| 3 |
| Ma le, ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ kwuru nime onwe-ha, si, Nwoke a nēkwulu Chineke. |
| Igbo Bible 2006
Igbo Bible Society of Nigeria 1906, 2006 |
| 1 |
| Jisọs banyekwara nꞌụgbọ mmiri nke kwọọrọ ya bịaruo na Kapanọm. |
| 2 |
| Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.” |
| 3 |
| Ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ sịrịtara onwe ha, “Nwoke a na-ekwulukwanụ Chineke.” |
| Igbo Bible 1988
No Data |