Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.
Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma.
Ugbu a, ka otuto dịrị Chineke onye nwere ike imere anyị karịa ka anyị pụrụ ịrịọ ya, ma ọ bụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nꞌuche anyị, site nꞌike ya na-arụ ọrụ nꞌime anyị. Ka otuto dịrị ya nꞌime nzukọ ya bụ chọọchị na nꞌime Kraịst mgbe nile, na site mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi! Amin.
Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.
Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke.
Mgbe ahụ Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Onye ìsì enweghị ike idu onye ìsì ibe ya, nihi na ha abụọ ga-adaba nꞌime olulu.
“Gịnị mere unu ji na-akpọ m Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ma unu adịghị eme ihe m gwara unu?
Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị.
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.