Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Mgbakwunye: [Ndị uwe ojii] 2 TIMỌTI 1:7Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.AISAIA 1:17AISAIA 6:8AISAIA 54:17JỌN 15:13Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya.JOSHUA 1:9LUK 1:79Ụbọchị ọhụrụ nke ga-ewetara ndị nọ nꞌọchịchịrị, na ndị nọ na ndagwurugwu nke ọnwụ ìhè. Ụbọchị ọhụrụ nke ga-edu anyị nꞌụzọ ga-eweta udo.”LUK 10:19Geenụ ntị. Enyela m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, ha agaghị emerụkwa unu ahụ. Enyekwala m unu ike imegide ike nile nke onye iro.LUK 5:9Nꞌihi na o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.ILU 21:15ILU 24:11ILU 27:17ABÙ ỌMA 101:8ABÙ ỌMA 82:3-4TAITỌS 3:1-2[1] Chetara ndị gị mkpa ọ dị ido onwe ha nꞌokpuru ọchịchị gọomenti na nꞌokpuru ndị na-achị achị. Ka ha naerubere ha isi, bụrụkwa ndị ọ na-agụ agụụ ime ezi ihe. [2] Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama ka ha bụrụ enyi mmadụ nile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nꞌebe mmadụ nile nọ. 1 PITA 2:13-17[13] Ana m arịọ unu nꞌaha Onyenwe anyị ka unu doo owe unu nꞌokpuru ọchịchị nile. Sọpụrụnụ ndị eze na ndị isi ọchịchị obodo. [14] Sọpụrụnụ ndị na-ejere ndị isi ọchịchị ozi nꞌihi na ha bụ ndị e zitere ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ na itokwa ndị na-eme ezi ihe. [15] Ọ bụ uche Chineke ka unu site nꞌihe ọma unu na-eme na ndụ unu kpuchie ọnụ ndị nzuzu, na okwu na-abaghị nꞌihe ha na-ekwu megide ozi ọma ahụ ha na-amaghị ihe ọ pụrụ imere ha, na ike dị nꞌime ya. [16] Bienụ ndụ unu dị ka ndị na-anọghị nꞌokpuru iwu. Ma unu ejikwala onwunwe unu nwe onwe unu eme ihe ọ bụla masịrị unu. Unu ejila ya eme ihe ọjọọ, kama na-ebinụ ndụ unu ime nanị ihe Chineke chọrọ mgbe nile. [17] Sọpụrụnụ mmadụ nile. Na-ahụkwanụ ndị nile kwere ekwe nꞌanya. Na-atụnụ egwu Chineke Nna, na-asọpụrụnụ ndị na-achị achị. ABÙ ỌMA 18:37-43ROM 13:1-14[1] Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya. [2] Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma. [3] Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ. [4] Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ. [5] Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee. [6] Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka unu ga-eji tụọ ụtụ taksi unu nꞌoge, ka ndị ọrụ gọọmentị nwee ike nọgide na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ha ịrụ. [7] Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru. [8] Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ. [9] Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị. [10] O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile. [11] Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya na-abịa nso. Ya mere, sitenụ nꞌụra bilie! Ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Nꞌezie ọ dị nso karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. [12] Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ, mgbe Kraịst ga-alọghachi. Ya mere, wezuganụ ọrụ ọjọọ nile nke ọchịchịrị, yikwasịkwanụ onwe unu ihe agha nke ezi ndụ, ụdị nke ndị bi nꞌihè kwesịrị iyiri. [13] Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha. [14] Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu. ILU 28:1-28LUK 11:21“Mgbe nwoke dị ike jiri egbe na mma chee ụlọ ya nche, mmadụ ọ bụla enweghị ike bata nꞌime ụlọ ahụ zuo ohi.MATIU 5:9Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. Igbo Bible 1988 No Data