Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Mgbakwunye: [Mwute]
Ndị na-eru uju bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akasị ha obi.
Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike.
Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.
Bikonụ ụmụnna m, gbaaranụ ife arụsị ọ bụla ọsọ.
[6] Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu. [7] Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.
[3] Anụkwara m oke olu si nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nꞌetiti ụmụ mmadụ. Ya na ha ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị ya. Ee, nꞌezie, Chineke nꞌonwe ya ga-anọkwa nꞌetiti ha bụrụkwa Chineke ha. [4] Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”
Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soro ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nꞌakwa soro ha bee akwa.
[16] Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nꞌakụkụ ebe ịchụ aja. E nyere ya ihe ịchụ aja na-esi isi ụtọ nke ọ ga-eji gwakọta ya na ekpere ụmụ Chineke, were ya chụọ aja nꞌihu Chineke nꞌebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo nke dị nꞌihu ocheeze Chineke. [17] Mgbe ahụ, isisi ụtọ nke ihe ahụ a chụrụ nꞌebe ịchụ aja ahụ, ya na ekpere ahụ ụmụ Chineke kpere, sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ mmụọ ozi ahụ jiri ya chụọ aja rigoro elu ruo nꞌebe Chineke nọ.
Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu.
Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.
Ụfọdụ ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ nụrụ mkpu akwa a sị na ọ bụ Ịlaija ka ọ na-akpọ ka ọ bịa nyere ya aka.
[6] Ya mere, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nꞌihi na ụbọchị ga-ewetara unu oke ọṅụ na-abịa. Ọ bụ ezie na unu nọ nꞌọnọdụ mwute ugbu a nꞌihi ọtụtụ mkpagbu na ọnwụnwa na-abịakwasị unu, ma ihe ndị a nile na-adị nanị nwa oge. [7] Ọnwụnwa na mkpagbu ndị a na-enyere unu aka ịnwapụta ma okwukwe unu nwere o sikwara ike. A na-anwa okwukwe unu dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya. Ya mere, ebe ọ bụ na okwukwe unu dị oke ọnụ ahia karịa ọlaedo, a ga-anwakwa unu ịhụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Ọ bụrụ na okwukwe unu eguzo chịm nꞌọnọdụ ọnwụnwa ndị a nile, iguzosi ike unu ga-ewetara unu otuto, ebube na nsọpụrụ nꞌụbọchị ahụ Jisọs ga-alọghachi.
Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.
Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị.
[24] Ka anyị hụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, nyere ha aka ma wulitekwa ha elu. [25] Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso.
[3] Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa. [4] Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke.
[36] Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’ [37] Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu nile. [38] Iwu ọzọ na-eso nke a nꞌịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya.’ [39] Iwu ndị ọzọ nile na ihe nile ndị amụma chọrọ ka unu mee dabeere nꞌebe iwu abụọ ndị a dị.” [40] Mgbe ahụ ndị Farisii gbara ya gburugburu, Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị,
Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke.
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”
[6] Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke. [7] Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.
Igbo Bible 1988
No Data