Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla rụrụ arụ ga-abata nꞌime ya. Otu a kwa ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, ma ọ bụ onye ụgha ga-abata nꞌime ya. Kama ndị ga-abata nꞌime ya bụ nanị ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ.
Ọ bụrụ na ị nọ nꞌelu ụlọ agbalịkwala ịrịdata ịbanye nꞌụlọ gị iwere ihe ọ bụla, kama gbaa nnọọ ọsọ dị ka ike gị ha!
“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe unu na-ahụbeghị mbụ, nke e kwuru okwu ya site nꞌọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nꞌebe nsọ, (onye na-agụ tụgharịa uche ghọta ihe ọ pụtara),
[26] Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha. [27] Ọzọ kwa, ndị ikom ha họrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta a. Nꞌụzọ dị otu a ha natakwara ntaramahụhụ kwesịri ha nꞌihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.