Isiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Mgbakwunye: [Talent] EFESỌS 2:10Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile.ỌPUPU 35:10JEMES 1:17Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.ILU 22:29JEREMAIA 4:4-51 KỌRINT 12:5-6[5] Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe. [6] E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile. 1 PITA 4:10-11[10] Ka onye ọ bụla jiri onyinye pụrụ iche Chineke nyere ya na-enyere ndị ọzọ aka. Bụrụnụ ndị ji onyinye dị iche iche Chineke nyere unu na-achịzi ezinụlọ Kraịst nke ọma. [11] Ọ bụrụ na Chineke nyere gị onyinye izisa ozi ọma na-ezisa ya dị ka a ga-asị na Chineke si nꞌọnụ gị na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enyere ndị ọzọ aka, were ike ahụ nile Chineke nyere gị mee ya. Ka e site nꞌime ihe nile nye Chineke otuto site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe ike na otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. ỌPUPU 31:3-5MATIU 5:14-16[14] Unu bụ ìhè nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nꞌelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo. [15] Ndị mmadụ adịghị amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nꞌelu ihe ịdọba iheọkụ, ka o nye ndị nile nọ nꞌụlọ ahụ ìhè. [16] Ya mere, unu ezokwala ìhè unu. Kwerenụ ka ìhè unu nwuore mmadụ nile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu bi nꞌeluigwe. MATIU 6:1-4[1] “Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe. [2] Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha. [3] Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, mmenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. [4] Chineke bụ Nna gị, onye maara ihe nzuzo nile, ga-akwụghachi gị ụgwọ zuru ezu. ROM 12:3-8[3] Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha. [4] Dị ka anyị nile nꞌotu nꞌotu si nwee anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, [5] otu a ka ọ dịkwa nꞌanụ ahụ Kraịst. Ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma anyị nile bụ otu anu ahụ e jikọtara ya na Kraịst. E sikwa otu a jikọtaa anyị nile nꞌotu nꞌotu, dị ka akụkụ dị iche iche nke dị nꞌotu anụ ahụ. [6] Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nꞌamara nye anyị. Ọ bụrụ na onyinye gị bụ onyinye ibu amụma, buo amụma dị ka okwukwe i nwere ha. [7] Ọ bụrụ na onyinye Chineke nyere gị bụ ijere ndị ọzọ ozi, mee ya, mezie ya emezie. Ọ bụrụkwa na onyinye nke gị bụ izi ihe, were obi dị umeala zie ha. [8] Onyinye gị bụrụ ịgba ndị mmadụ ume site nꞌikwusa okwu Chineke, biko mee ya nꞌụzọ ndị ọzọ gaesi nata inyeaka. Ọ bụrụkwanụ na onyinye gị bụ inye ndị nọ na mkpa ụfọdụ nꞌime ihe i nwere, gbasapụ aka nye ha. Ọ bụrụ na i nwere onyinye ịbụ onyendu, kpachapụ anya duzie ndị i na-edu. Ka ndị Chineke nwere onyinye inwe obi ebere nꞌebe ndị mmadụ nọ, jiri obi ọcha zipụta onyinye ha. 1 KỌRINT 12:1-11[1] Ugbu a ụmụnna m, ka anyị gafee nꞌokwu gbasara onyinye dị iche iche Mmụọ Nsọ na-enye. Aga m akọwa ya nꞌụzọ ọ ga-esi doo unu nile anya. [2] Unu ga-echeta na tupuu unu abụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst unu bụ rị ndị na-eso arụsị nke na-adịghị ekwu okwu ọ bụla. [3] Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị na-asị na Mmụọ Nsọ Chineke si nꞌọnụ ha na-ekwu okwu. Ùnu ga-esi aṅaa mata na ọ bụ Chineke si nꞌọnụ ha ekwu okwu nꞌezie? O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịkpọku aha Jisọs sị, “Jisọs bụ Onyenwe m” ma ọ bụghị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla Mmụọ Chineke na-achị nke pụrụ ịsị, “Jisọs bụ onye a bụrụ ọnụ.” [4] Ọ bụ ezie na onyinye Mmụọ Nsọ Chineke dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha. [5] Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe. [6] E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile. [7] Mmụọ Nsọ na-arụpụta ọrụ ya nꞌime onye ọ bụla nꞌụzọ ọ ga-esi bara chọọchị nile uru. [8] Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ. [9] Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. [10] Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. [11] Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma. Igbo Bible 1988 No Data