Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.”
[8] Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta. [9] Unu agwala ibe unu okwu ụgha, nꞌihi na unu eyipụla mmadụ ochie ahụ na-eme ụdị omume a. [10] Ugbu a unu eyikwasịla ndụ ọhụrụ ahụ, nke bụ mmadụ ọhụrụ ahụ Chineke onye kere ya na-eme ka ọ na-adị ọhụrụ mgbe nile, na nke na-agbalị ịdị ka Kraịst. [11] Nkewa ọ bụla adịghị nꞌime ndụ a. Ọ dịghị mkpa ebe onye ọ bụla si pụta, ma ọ bụ onye Juu ma ọ bụ onye mba ọzọ, ma ọ bụ onye e biri ugwu, ma ọ bụ onye a na-ebighị ugwu. Ọ dịkwaghị mkpa ma ọ bụ onye na-asụ asụsụ ọzọ, ma ọ bụ onye ime ọhịa, ma ọ bụ ohu, ma ọ bụkwanụ onye nwe onwe ya. Ihe dị mkpa bụ ma Kraịst o bikwa nꞌime onye ahụ, nꞌihi na Kraịst dịrị mmadụ nile. [12] Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi. [13] Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu.
Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị.
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.
“Nanị okwu ilu jupụtara ha nꞌọnụ.
[14] “Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha. [15] Ma mgbe unu na-ebu ọnụ, dịnụ mma ile anya.
[19] Chetanụ nke a ụmụnna m. Ka onye ọ bụla nwee ntị na-anụ ihe ọsịịsọ, na ire dị arọ ikwu okwu. Ka onye ọ bụla bụrụ onye iwe na-adịghị ewe ọsịịsọ. [20] Nꞌihi na iwe mmadụ abụghị ụzọ ziri ezi anyị pụrụ isi rụpụta ihe Chineke gụrụ dị ka ezi ihe.
[14] Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke. [15] Ka onye ọ bụla hapụ ime ihe ga-egbochi ihuọma Chineke. Ekwela ka obi ilu gbaa mgbọrọgwụ nꞌime unu ibutere unu nsogbu. Ụdị obi ilu ahụ pụrụ ime ka ndị ọzọ daa mba nꞌokwukwe ha.
[31] Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu. [32] Nꞌọnọdụ ihe ndị a nile, nweenụ obi ọma nꞌebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dị ka Chineke sitere nꞌamara ya gbaghara unu nꞌihi na unu bụ nke Kraịst.