Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Chọọchị: [Churchga Churchka]
[24] Ka anyị hụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, nyere ha aka ma wulitekwa ha elu. [25] Ka anyị ghara ilefu isoro ndị kwere ekwe ọzọ na-enwe nzukọ dị ka ụfọdụ na-eme. Ka anyị dụọ onwe anyị ọdụ, dọọkwa onwe anyị aka na ntị banyere nke a, karịsịa ugbu a anyị maara na ọbịbịa Onyenwe anyị na-abịa nso.
Nꞌihi na ebe ọ bụla mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara nꞌaha m, mụ onwe m nọ nꞌetiti ha.”
Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele.
[11] Ọ bụkwa ya nyere ndị mmadụ onyinye. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ ndị ozi, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị amụma, ndị ọzọ onyinye ikwusa ozi ọma, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ụkọchukwu, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ozizi. [12] Gịnị mere o jiri nye ha onyinye ndị a? O nyere onyinye ndị a ime ka ụmụ Chineke bụrụ ndị zuru oke ịrụrụ Chineke ọrụ iwuli nzukọ ya bụ ahụ Kraịst elu. Ka onye ọ bụla nꞌime ụmụ Chineke bụrụ ndị dị ike na ndị tozuru oke nꞌihe ọmụma, [13] tutuu anyị nile ekwekọtaa nꞌotu ihe ahụ banyere nzọpụta anyị, tutuu anyị enwee ọmụma ihe juru eju banyere Ọkpara Chineke. Na tutuu anyị abụrụ ndị tozuru oke nꞌime Onyenwe anyị, mgbe e mere ka ọdịdị Kraịst jupụta nꞌime anyị.
Ha jiri oge nile ha nwere na-anụ ihe ndị ozi Kraịst na-ezi ha. Ha kenyere ndị ọzọ ihe ha nwere.
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nꞌige ntị nꞌozi ọma a ka mmadụ ji ekwere. Ozi ọma bụkwanụ ikwusa Jisọs Kraịst.
Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya.
[31] Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba. [32] Otu oge, mgbe Pita na-ejegharị site nꞌobodo ruo nꞌobodo, ọ gara ileta ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo Lida.
Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.
Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ nanị, site nꞌụzọ dị otu a na-aghọgbu onwe unu. Kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.
Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.
Unu abụla ndị na-eji ntị ha na-anụ okwu ndụ ahụ nanị, site nꞌụzọ dị otu a na-aghọgbu onwe unu. Kama bụrụnụ ndị na-eme ihe okwu ahụ kwuru.
kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ.
[19] Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. [20] Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ ụwa.”
[19] Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ. [20] Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe nile, ruo ọgwụgwụ ụwa.”
Igbo Bible 1988
No Data