Isiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Chọọchị: [Na-asụ Asụsụ] 1 KỌRINT 1:5Nꞌihi na Chineke emeela ka unu baa ụba nꞌụzọ nile, ebe ọ bụ na unu na Kraịst bụ otu. O meekwala ka unu nwee nghọta zuru ezu banyere eziokwu nile. Ọ na-emekwa ka unu nwee ike na-ekwuwapụta okwu banyere ozi ọma ya.ỌLU OZI 2:4E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.ỌLU OZI 19:6Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nꞌasụsụ dị iche iche, buokwa amụma.GALETIA 5:22Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, naMAK 16:17“Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche.1 KỌRINT 14:2Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị.1 KỌRINT 14:23Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri?1 KỌRINT 14:27-28[27] A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu nꞌime chọọchị, ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nꞌotu nꞌotu nꞌusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nꞌebe ahụ. [28] Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịtaa ya. 1 KỌRINT 12:8-11[8] Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ. [9] Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa. [10] Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu. [11] Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma. 1 KỌRINT 13:1-13[1] A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme. [2] A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla. [3] A sịkwa na m ewere ihe nile m nwere nye ndị ogbenye, kwerekwa ka e ree m ọkụ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst, ihe ndị a nile abaghị uru, ma ọ bụrụ na m ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya. [4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. [5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya. [6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya. [7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta. [8] Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga. [9] Ugbu a ihe anyị maara adịghị ukwuu, mmụta anyị na amụma anyị na-ebu ezughị oke, nꞌihi na ihe anyị maara bụ nanị nwa ntịị. [10] Ma mgbe e mere ka anyị zuo oke, mgbe ahụ, mkpa nke onyinye ndị a na-ezughị oke na-egboro anyị agaghị adịkwa. Onyinye ndị a ga-agwụsịkwa. [11] Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ. [12] Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a. [13] Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya. 1 KỌRINT 14:1-40[1] Ka ịhụ mmadụ ibe unu nꞌanya bụrụ ihe na-agụsi unu agụụ ike. Rịọkwanụ Chineke ka o nye unu onyinye nke Mmụọ Nsọ ya na-enye, nke ka nke, onyinye ibu amụma, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke. [2] Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị. [3] Ma onye ahụ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ okwu na-enyere ha aka ito eto nꞌime Onyenwe anyị. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu. [4] Ya mere, nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma na-enyere chọọchị nile aka ito eto nꞌime mmụọ, ma nwoke ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere nanị onwe ya aka. [5] Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu nile nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ma ọ ga-atọ m karịa ma ọ bụrụ na unu nile enwee onyinye izisa ozi ọma. Nke a bụ nꞌihi na nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma bara uru karịa nwoke na-asụ asụsụ dị iche iche. Ịsụ asụsụ ya ga-aba uru ma ọ bụrụ na ọ dị onye na-aghọta ihe ọ na-asụ, onye nwekwara ike ikọwara chọọchị ihe o kwuru. [6] Ụmụnna m ọ bụrụ na m bịakwutere unu malite ịsụ asụsụ nke unu na-adịghị anụ, olee uru m baara unu? Ọ baghị uru ọ bụla! Kama ọ bụrụ na m ekwuo okwu nꞌụzọ doro anya, banyere ihe Chineke kpughere gosi m, ma ọ bụ ihe nile m maara, ma ọ bụ ihe gaje ime, ma ọ bụ ozizi nke eziokwu Chineke, nke a ọ̀ gaghị abara unu uru? [7] Ọ bụkwa otu a ka ọ dị nꞌetiti ihe nile na-enweghị ndụ, ma ha bụ ihe na-eme ụzụ dị ka opi, ma ọ bụ ụbọ akwara. O nweghị onye ga-aghọta ihe onye na-afụ opi na-egbu ma ọ bụ ihe onye na-akpọ ụbọ akwara na-akpọ ma ọ bụrụ na ọ maliteghị ya nke ọma. [8] Ọ bụrụkwa na nwoke na-egbu opi ike egbuzighị ya dị ka o si kwesị, olee otu ndị agha ga-esi mata na agha dị? [9] Nꞌotu aka ahụ kwa, ọ bụrụ na ị na-agwa mmadụ okwu nꞌasụsụ ọ na-adịghị anụ, olee otu ọ ga-esi ghọta ihe ị na-ekwu? Ịgwa mmadụ okwu otu ahụ dị ka mmadụ ichenye ọnụ nꞌezi na-ekwuru ifufe okwu. [10] Asụsụ a na-asụ nꞌụwa a dị ukwuu, ma ha nile bara uru nye ndị na-anụ ha. [11] Ọ bụrụ na mmadụ e jiri otu nꞌime asụsụ ndị a gwa m okwu, aga m abụ ọbịa nꞌebe onye na-asụrụ m asụsụ ahụ m na-adịghị anụ nọ, ya onwe ya ga-abụkwa ọbịa nꞌebe m nọ. [12] Ebe unu na-achọsi ike inwe onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ Chineke elu. [13] Ọ bụrụ na Chineke nyere onye ọ bụla onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, ya rịọ Chineke ka o nyekwa ya ike ịkọwa ihe ọ na-ekwu. [14] Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe. [15] Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị jirikwa uche kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m ghọtara. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị, jirikwa uche m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m ghọtara, ka m nwee ike ịmata ihe m na-ekwu na ihe m na-abụ nꞌabụ. [16] Nꞌihi na mgbe i ji asụsụ nke ndị ọzọ na-amaghị na-ekpere Chineke ekpere, olee otu ndị nile nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amin? [17] Ọ bụ ezie na ekpere gị ga-ama mma, ma o nyereghị onye ahụ na-anụghị ya aka. [18] Ana m ekele Chineke nꞌihi na ana m asụ asụsụ dị iche iche karịa unu nile. [19] Ma mgbe ọ bụla ndị Kraịst zukọrọ nꞌofufe, ọ na-akara m mma ikwu nanị mkpụrụ okwu ise nke mmadụ nile ga-aghọta na nke ga-abakwara ha uru, karịa na m kwuru puku mkpụrụ okwu iri nꞌasụsụ dị iche nke onye ọ bụla na-apụghị ịghọta. [20] Ụmụnna m, unu abụla ụmụntakịrị nꞌechiche unu. Bụrụnụ ụmụntakịrị nꞌihe gbasara ime ihe ọjọọ, ma bụrụnụ ndị nwere uche nꞌihe gbasara ụdị okwu a. [21] E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na Chineke ga-eji asụsụ ndị mba ọzọ gwa ndị ya bụ ụmụ Izirel okwu, ma ha agaghị ege ntị. [22] Nke a na-egosi na ịsụ asụsụ dị iche iche abụghị ihe dị mkpa nye ndị kwere ekwe, kama ọ bụ ihe ịrịba ama nye ndị na-ekweghị ekwe. Ma ibu amụma, nke bụ ikwusa eziokwu Chineke, bụ ihe dị ndị kweere na Kraịst mkpa. Ndị na-ekweghị ekwe anaghị ahụ mkpa nke a dị. [23] Ọ bụrụ na onye na-ekweghị na Kraịst abata nꞌụlọ chọọchị unu mgbe unu nile ji asụsụ dị iche iche na-ekwu okwu, gịnị ka ọ ga-eche? Ọ̀ gaghị asị na unu nile bụ ndị ara, ndị isi mebiri? [24] Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ. [25] Mgbe ọ ga-anọ na-ege ntị, ihe ọ ga-anụ ga-emekụta echiche nzuzo ya nile, mee ka ndụ ọjọọ ya pụta ìhè. Nke a ga-emekwa ka o gbuo ikpere nꞌala kpọọ isi ala nye Chineke sị, “Nꞌezie, Chineke nọ nꞌetiti unu.” [26] Ugbu a, ụmụnna m, gịnị bụ isi ihe m na-ekwu? Mgbe ọ bụla unu zukọrọ ife Chineke, ụfọdụ kwesịrị ịbụ abụ, onye ọzọ ga-ezi unu ihe, ma ọ bụ gwa unu ozi dị mkpa Chineke gosiri ya, ma ọ bụ jiri asụsụ nke ọ na-amụghị gwa unu okwu, ka onye ọzọ kọwaa ihe onye ji asụsụ a dị iche kwuo okwu kwuru. Ma ka ihe ọ bụla e mere nꞌime ụlọ chọọchị bụrụ ihe ga-abara onye ọ bụla uru. [27] A sịkwa na ọ dị ndị chọrọ iji asụsụ dị iche kwuo okwu nꞌime chọọchị, ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ kwuo. Kama ka ha kwuo nꞌotu nꞌotu nꞌusoro. Ka onye ga-akọwa ihe ha kwuru nọrọkwa nꞌebe ahụ. [28] Ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-akọwa ihe ha na-asụ, ka onye ahụ na-asụ asụsụ dị iche mechie ọnụ ya. Ya na Chineke sụrịtaa ya. [29] Ka mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ nwere onyinye ibu amụma kwuo okwu nꞌotu nꞌotu, mgbe mmadụ nile nọrọ nwayọọ na-ege ha ntị. [30] Ọ bụrụ na onye ọzọ anata ozi site nꞌaka Chineke, mgbe onye ọzọ na-ekwu okwu, ka onye ahụ natara ozi ahụ chere tutuu onye nke na-ekwu ekwuchaa tupuu o kwuo nke ya. [31] Nꞌụzọ dị otu a, ndị nile nwere onyinye ibu amụma nwere ike izisa ozi ọma Chineke. Nꞌụzọ dị otu a kwa, a ga-enyere mmadụ nile aka kasiekwa ha obi. [32] Chetanụ na onye ahụ Chineke chọrọ isite nꞌọnụ ya kwuo okwu nwere ike iji ndidi chere ruo mgbe o ruru oge nke ya ikwu okwu. [33] Nꞌihi na Chineke abụghị onye na-achọ ka ihe nile na-aga aghara aghara. Chineke chọrọ ka ihe nile na-aga nꞌusoro nꞌime chọọchị nile nke ndị ya. [34] Ụmụ nwanyị ekwesịghị ikwu okwu nꞌime chọọchị. Ha ekwesịghị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọ bụla, nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-edo onwe ha nꞌokpuru ụmụ nwoke. [35] Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nꞌụlọ. Nꞌihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nꞌime ọgbakọ chọọchị. [36] Ùnu jụrụ ịnabata okwu a? Ùnu chere na okwu Chineke malitere nꞌaka unu? Ùnu chekwara na ọ ga-akwụsị nꞌaka unu? Ụgha! [37] Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, ma ọ bụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, nanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nꞌonwe ya nyere m. [38] Ọ bụrụ na ọ dị onye nọgidere jụ ige ntị nꞌihe m kwuru nꞌakwụkwọ a, unu aṅala ya ntị! [39] Ya mere, ụmụnna m, ka ibu amụma bụrụ ihe na-agụ unu agụụ, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke nꞌụzọ doro anya. Kama unu akwụsịkwala ndị nwere onyinye ịsụ asụsụ nke ha na-amụghị amụ. [40] Ma meenụ ihe nile nꞌụzọ dị mma, ka ha dịkwa nꞌusoro. Igbo Bible 1988 No Data