Isiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Chọọchị: [Mmụọ Nsọ] IKPE 3:10-14MATIU 12:31-33[31] “Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara. [32] Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa. [33] “Osisi ọma na-amị mkpụrụ ọma. Osisi ọjọọ na-amị mkpụrụ ọjọọ. A na-amata osisi ọ bụla site na mkpụrụ ọ na-amịpụta. LUK 24:45-49[45] Mgbe ahụ o meghere akọnuche ha, ime ka ha ghọta ihe nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere ya. [46] Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ. [47] E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem. [48] Unu bụkwa ndị akaebe na ihe nile ndị amụma kwuru emezuola. [49] “Ma nọdụnụ nꞌobodo Jerusalem a tutuu Mmụọ Nsọ abịa mejupụta unu nꞌike. Nꞌihi na aga m ezite ya ka ọ bịakwasị unu dị ka Nna m kwere nkwa ime.” JỌN 3:6-8[6] Dị ka mmadụ nwere ike mụọ mmadụ ibe ya, otu a kwa, ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ pụrụ ịmụ mmadụ nꞌime Mmụọ Nsọ. [7] Ya ejule gị anya na m sịrị, ‘A ghaghị ịmụ gị ọzọ.’ [8] Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.” ROM 8:2-6[2] Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị. [3] A zọpụtaghị anyị nꞌihi na anyị debere iwu, nꞌihi na ọ dịghị mgbe anyị na-edebe ya, anyị enwekwaghị ike idebe ya. Ma Chineke sitere nꞌụzọ dị iche zọpụta anyị. Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bịa nꞌụdị anyị bụ mmadụ ka ọ laa ike nke mmehie nꞌiyi, site nꞌiji onwe ya chụọ aja nꞌihi mmehie anyị. [4] Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ. [5] Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ. [6] Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo. 2 KỌRINT 5:16-18[16] Anyị onwe anyị adịghị elekwa onye ọ bụla anya site nꞌihe ndị mmadụ na-eche banyere ha. Nꞌihi na anyị sitere nꞌụzọ dị otu a lee Kraịst anya, chee na ọ bụ mmadụ efu. Ma ugbu a anyị amakwaghị ya nꞌụzọ dị otu a. [17] Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela. [18] Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nꞌaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo. Ma ugbu a o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nꞌudo. 1 IHE EMERE 12:18-20ABÙ ỌMA 52:1-3MAIKA 3:8-10ỌLU OZI 2:1-5[1] Nꞌụbọchị mmemme owuwe ihe ubu, nke bụ Pentikọọsụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst nile zukọrọ nꞌotu ebe. [2] Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ. [3] Ndị na-eso ụzọ Kraịst hụrụ ihe yiri ire ọkụ. Ire ọkụ ndị a nọkwasịrị nꞌisi ha nile nꞌotu nꞌotu. [4] E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ. [5] Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem. LUK 24:45-47[45] Mgbe ahụ o meghere akọnuche ha, ime ka ha ghọta ihe nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ banyere ya. [46] Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ. [47] E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem. 1 JỌN 2:19-27[19] Ndị a na-emegide Kraịst ugbu a si nꞌọgbakọ anyị pụọ. A sị na ha bụ ndị na-eso Kraịst nꞌezie ha agaraghị esite nꞌọgbakọ anyị pụọ. Ma ha hapụrụ anyị pụọ igosi na o nweghị oge ha ji bụrụ ndị na-eso Kraịst. [20] Ma unu adịghị ka ndị ahụ si nꞌọgbakọ anyị pụọ, nꞌihi na Mmụọ Nsọ Chineke nọ nꞌime unu. Unu amụtakwala eziokwu Chineke. [21] Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dị ka ndị ịmụta ihe bụ ezi ozizi dị mkpa, kama ọ bụ ka m dọọ unu aka na ntị ka unu bụrụ ndị na-asa anya unu mmiri ịchọpụta ihe bụ eziokwu nꞌoge a ajọ ozizi dị. [22] Ònye bụ onye okwu ụgha ahụ kachasị ndị okwu ụgha nile? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye iro Kraịst, onye na-emegide Kraịst. Nꞌihi na o kwereghị na Chineke ma ọ bụ na Jisọs Ọkpara ya. [23] Ya mere, onye ọ bụla naekweghị na Kraịst enwekwaghị Chineke ma ọlị. Ma onye ahụ nwere Kraịst nwere Chineke bụ Nna. [24] Ya mere, nọgidenụ nꞌokwukwe unu, dị ka e ziri unu site na mbụ. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu na Chineke Nna na Kraịst Ọkpara ya gaenwe ezi nnwekọ na-adịgide. [25] Kraịst nꞌonwe ya ekwela anyị nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi. [26] Ana m edere unu ihe ndị a ime ka unu mara ihe banyere ndị iro ahụ na-emegide Kraịst. Nꞌihi na ha na-agbalịsi ike iduhie ndị mmadụ. [27] Ma unu anatala Mmụọ Nsọ, onye bụ otite mmanụ ahụ Chineke tere unu. Mmụọ Nsọ ahụ na-ebigidekwa nꞌime unu mgbe nile izi unu ihe bụ eziokwu. Onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Nanị ya bụ onye ozizi na-ezi ihe bụ eziokwu oge nile. Mmụọ Nsọ na-agwakwa unu sị unu nọgide nꞌime Kraịst. Ya mere, unu esitekwala nꞌime ya pụta. Igbo Bible 1988 No Data