Isiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Chọọchị: [Ndi ozuzu aturu] 2 TIMỌTI 4:2kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ.ỌLU OZI 20:28“Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha.HIBRU 13:17Ruberenụ ndị isi unu isi. Gbalịanụ ime ihe ha gwara unu. Nꞌihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụ obi unu. Chineke ga-ekpekwa ha ikpe dị ka ọrụ ha si dị. Ruberenụ ha isi ka ha nwee obi aṅụrị ịrụ ọrụ ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha ejiri ihu mgbarụ rụọ ọrụ ha, ọrụ ha agaghị abara unu uru.JEMES 3:1Ụmụnna m, ka ọtụtụ nꞌime unu hapụ ịgbalị ịbụ ndị ozizi, ndị ọrụ ha bụ igosi ndị ọzọ ebe ha siri mehie. Nꞌihi na ebe ndị nkuzi bụ ndị a na-ele anya na ha ma ihe karịa ibe ha, ha gaanata ikpe ọmụma karịrị ukwuu ma ọ bụrụ na ha emehie.JEREMAIA 3:15ILU 23:27EFESỌS 4:11-12[11] Ọ bụkwa ya nyere ndị mmadụ onyinye. Ụfọdụ ka o nyere onyinye ịbụ ndị ozi, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị amụma, ndị ọzọ onyinye ikwusa ozi ọma, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ụkọchukwu, ndị ọzọ onyinye ịbụ ndị ozizi. [12] Gịnị mere o jiri nye ha onyinye ndị a? O nyere onyinye ndị a ime ka ụmụ Chineke bụrụ ndị zuru oke ịrụrụ Chineke ọrụ iwuli nzukọ ya bụ ahụ Kraịst elu. Ka onye ọ bụla nꞌime ụmụ Chineke bụrụ ndị dị ike na ndị tozuru oke nꞌihe ọmụma, 1 PITA 5:1-4[1] Mụ onwe m, onye bụkwa okenye chọọchị, na-agwa ndị okenye chọọchị nile nọ nꞌetiti unu okwu a. Eji m anya m abụọ hụ Kraịst mgbe ọ nwụrụ nꞌelu obe. Aga m esokwa keta oke nꞌebube ya na otuto ga-abụ nke ya mgbe ọ lọghachiri. [2] Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi. [3] Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha. [4] Nke a ga-eme ka unu nata ụgwọ ọrụ iketa oke nꞌebube ahụ na-agaghị agwụ agwụ, mgbe onye ọzụzụ atụrụ dị ukwuu ahụ bịara. TAITỌS 1:5-9[5] Ahapụrụ m gị na Kriit ka i dozie ihe ọ bụla dị mkpa nꞌusoro nke ga-enyere ụlọ nzụkọ dị nꞌebe ahụ aka. Ahapụkwara m gị ka ị họpụta ndị isi chọọchị nꞌobodo ahụ nile, ndị ga-eme ihe m nyere gị nꞌiwu. [6] Ndị isi chọọchị ọ bụla ị ga-ahọpụta ga-abụ ndị a maara nke ọma dị ka ndị na-enweghị ntụpọ, ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị ụmụ ha kwa bụ ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya, nke ndị mmadụ na-agbara akaebe dị mma na ha abụghị ụmụ naebi ndụ ọjọọ, na ndị na-adịghị erube isi. [7] Ebe ndị isi chọọchị a ga-abụ ndị na-elekọta ọrụ Chineke, ha ga-abụ ndị mmadụ na-apụghị ibo ebubo ihe ọjọọ ọ bụla. Ha agaghị abụ ndị nganga, ndị na-ewe iwe ọkụ, ndị isi ike, ndị na-alụ ọgụ nꞌihi ịṅụbiga mmanya oke, ndị hụrụ ego nꞌanya. [8] Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke. [9] Ha ga-abụkwa ndị guzosiri ike nꞌeziokwu nke ozi ọma ahụ anyị ziri ha. Nke a ga-eme ka ha nwee ike izi ndị ọzọ eziokwu ahụ, na iji ya zi ndị ahụ na-arụ ụka ebe ha si jehie. EZIKIEL 34:1-101 TIMỌTI 3:1-13[1] Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ. [2] Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya. [3] *** [4] Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinụlọ nke aka ya nke ọma. Onye nwere ụmụ ndị dị nwayọọ na ndị na-asọpụrụ ya. [5] Nꞌihi na ọ bụrụ na nwoke enweghị ike chịkọtazie ezinụlọ ya ọ̀ ga-esi aṅaa chịzie ụlọ chọọchị Chineke. [6] Onye a ga-enye ụdị ọrụ a agaghị abụ onye nabatara Kraịst ọhụrụ, nꞌihi na ọnọdụ dị elu a pụrụ ime ka o bido ịnya isi. Unu maara na ịnya isi nwere ike ibutere ya ịla nꞌiyi. Dị ka ekwensu si welie onwe ya elu, ma Chineke chụpụrụ ya. [7] Onye a ga-enye ọnọdụ a aghaghị ịbụ onye ndị na-abụghị ndị Kraịst na-agba ezi ama banyere, ka ekwensu hapụ isiste nꞌọnụ ndị a boo ya ebubo ga-eme ka ọ ghara inwe nkwuwa okwu ịchịzi ndị nọ nꞌokpuru ya. [8] Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị omume ha dị mma na ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị hụrụ ego nꞌanya. [9] Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike. [10] Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị. [11] Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke. [12] Ndị nile a ga-ahọpụta ije ozi na chọọchị aghaghị ịbụ ndị nwere nanị otu nwụnye, ndị na-achịzi ụmụ ha na ezinụlọ nke aka ha nke ọma. [13] Nꞌihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkuwa okwu ha nwere banyere okwukwe ha nꞌime Kraịst Jisọs. Igbo Bible 1988 No Data