Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Chineke: [Bịa Dị Ka Are Bụ]
[27] “Nna m enyefeela m ihe nile nꞌaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya. [28] Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike. [29] Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike. [30] Nꞌihi na ụzọ m dị mfe, ibu m ga-ebokwasịkwa unu adịghị arọ.”
[63] Ma ụfọdụ nꞌime unu ekwenyeghị.” Nꞌihi na Jisọs maara site na mmalite ndị ahụ na-ekwereghị. Ọ matakwara onye ahụ ga-arara ya nye. [64] Ya mere ọ gwakwara ha okwu sị, “Ọ bụ nke a mere m ji gwa unu okwu sị, ọ dịghị onye ọ bụla ga-abịakwute m ma ọ bụghị na Nna m mere ka ọ bịakwute m.” [65] Site nꞌoge a ọtụtụ nꞌime ndị na-eso ya kwụsịrị iso ya. Ha esokwaghị ya na-agagharị ebe nile ọ na-aga.
Bịakwutenụ m unu nile ndị ike gwụrụ ibu ibu arọ e bokwasịrị unu. Aga m enyekwa unu izuike.
[7] “Ndị ihu abụọ! Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu bụ eziokwu. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ya kwuo sị, [8] ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ. [9] Ịkpọ isi ala ha bụ ihe efu, nꞌihi na ọ bụ ozizi mmadụ ka ha na-ezi nꞌọnọdụ iwu Chineke.’ ”
[13] Otu ụbọchị, ụfọdụ ụmụ nwanyị kuuru ụmụ ha na-abịakwute Jisọs ka o metụ ha aka gọzie ha. Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ha, ha chụpụrụ ụmụ nwanyị ndị a, gwa ha na o kwesịghị ka ha nye Jisọs nsogbu. [14] Ma mgbe Jisọs hụrụ ihe a ndị na-eso ụzọ ya mere, o wutere mmụọ ya. Ọ baara ha mba sị, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze Chineke dịịrị ndị dị otu a. [15] Eziokwu ka m na-agwa unu, onye ọ bụla na-anabataghị alaeze Chineke dị ka ụmụaka ga-esi nabata ya, agaghị abanye nꞌime ya.” [16] Mgbe ahụ Jisọs kuuru ụmụntakịrị ahụ nꞌaka ya. O bikwasịrị ha aka nꞌisi, gọzie ha.
[6] Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.” [7] Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ. [8] Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ.
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.
“Ka m gwa unu eziokwu, mmadụ ọ bụla nụrụ okwu m ma kwerekwa na Chineke onye zitere m, nwere ndụ ebighị ebi. Ọmụma ikpe adịkwaghị nye onye ahụ. Kama o sitela nꞌọnwụ banye na ndụ.
[1] Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu. [2] Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.
Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu.
Ma unu achọghị ịbịakwute m ka m nye unu ndụ ebighị ebi.
[44] E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘A ga-akụziri mmadụ nile ihe banyere Chineke.’ Onye ọ bụla Chineke gwara okwu, nke mụtakwara eziokwu ahụ site nꞌaka Chineke ga-abịakwute m. [45] Nke a apụtaghị na onye ọ bụla ahụla Nna m anya. Ọ bụ nanị m hụrụ ya, nꞌihi na ọ bụ site nꞌebe ọ nọ ka m si bịa.
[37] Nꞌụbọchị ikpeazụ bụ ụbọchị dị mkpa nꞌoge mmemme ahụ, Jisọs guzoro ọtọ tie mkpu sị, “Ọ bụrụ na akpịrị na-akpọ onye ọ bụla nkụ ya bịakwute m, bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ. [38] Ọ bụrụ na unu ekwere na m, dị ka akwụkwọ nsọ kwuru, Chineke ga-eme ka isi iyi mmiri na-enye ndụ site nꞌime unu naasọpụta.” [39] (Jisọs na-ekwu okwu banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kweere na ya ga-anata. Nꞌoge ahụ Mmụọ Nsọ abịabeghị nꞌihi na Jisọs alaghachibeghị nꞌebube ya nꞌeluigwe).
[14] Ma anyị nwere Jisọs Ọkpara Chineke dị ka onyeisi nchụaja ukwu nke ndụ anyị. Ọ nọ ugbu a nꞌeluigwe nꞌihu Chineke. Nꞌihi nke a ka anyị jidesie okwukwe ahụ anyị kwupụtara aka ike. [15] Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya. [16] Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.
[16] “Mụ onwe m bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gwa gị ihe ị ga-agwa nzukọ m nile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ ji Devidi ndụ, na onye si nꞌagbụrụ ya pụta. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ, nke na-enwụ ezi onwụnwụ.” [17] Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọ bụla nụrụ ịkpọ oku ha kpọkuokwa ndị ọzọ sị ha, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa. Onye ọ bụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ nꞌefu, na-akwụghị ụgwọ ọ bụla.
Ma ụfọdụ ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa ndị nile Nna m nyere m ma ha bịakwute m.
Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọ bụla nụrụ ịkpọ oku ha kpọkuokwa ndị ọzọ sị ha, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa. Onye ọ bụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ nꞌefu, na-akwụghị ụgwọ ọ bụla.
Agwọ ukwu a bụ agwọ ochie ahụ a na-akpọ ekwensu, nke na-eduhie ndị nile bi nꞌụwa. A chụturu ya nꞌụwa, ya na ndị agha ya nile.
Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”
[19] Nꞌihi nke a ụmụnna m, anyị nwere ike ugbu a ịga nꞌihu Chineke. Ọbara Jisọs emegheelara anyụ ụzọ ịbịaru Chineke nso. [20] Jisọs Kraịst emegheelara anyị ụzọ ndụ ọhụrụ. O mere nke a site nꞌinye ahụ ya ka ọ bụrụ ihe e tiwara dị ka akwa mgbochi ụlọ nsọ, nke nọchiri nꞌetiti anyị na Chineke. [21] Ugbu a anyị nwere Jisọs Kraịst dị ka onyeisi nchụaja anyị! Ọ na-achị nꞌụlọ Chineke. [22] Ka anyị bịaruo Chineke nso site nꞌobi nke aghụghọ na-adịghị, obi nke nwere okwukwe na ọ ga-anabata anyị, obi nke e fesara ọbara maka ime ka anyị si nꞌechiche ọjọọ nile nke obi gbagọrọ agbagọ dị ọcha, na ahụ nke e ji mmiri dị ọcha sachapụ.
Igbo Bible 1988
No Data