Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Chineke: [Iwu]
Ma banyere ajụjụ ị jụrụ m, ị maara ihe banyere iwu ndị a nke na-asị, egbula mmadụ, akwala iko, agbala ama ụgha, aghọgbula mmadụ ibe gị, sọpụrụ nna gị na nne gị?”
Nwoke ahụ zara sị, “Edebezuchaala m iwu ndị a nile siterị na mgbe m bụ nwanta.”
[34] Otu onye nꞌime ha bụ onye ozizi iwu bịara jụọ Jisọs ajụjụ iji nwaa ya sị, [35] “Onye ozizi, olee iwu kachasị mkpa nꞌime iwu nile Mosisi nyere anyị?” [36] Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’ [37] Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu nile. [38] Iwu ọzọ na-eso nke a nꞌịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya.’ [39] Iwu ndị ọzọ nile na ihe nile ndị amụma chọrọ ka unu mee dabeere nꞌebe iwu abụọ ndị a dị.” [40] Mgbe ahụ ndị Farisii gbara ya gburugburu, Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị,
Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.
[16] Otu nwoke bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” [17] Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ banyere ihe ziri ezi? Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ọ bụrụ na ị chọrọ iketa alaeze eluigwe gaa debe iwu nile Chineke nyere.” [18] Nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara sị ya, “Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha. [19] Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.”
[36] Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’ [37] Nke a bụ iwu nke mbụ, bụrụkwa iwu kachasị iwu nile. [38] Iwu ọzọ na-eso nke a nꞌịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya.’ [39] Iwu ndị ọzọ nile na ihe nile ndị amụma chọrọ ka unu mee dabeere nꞌebe iwu abụọ ndị a dị.” [40] Mgbe ahụ ndị Farisii gbara ya gburugburu, Jisọs jụrụ ha ajụjụ sị,
[17] Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị mmadụ pụrụ ijide unu kpọrọ unu gaa nꞌụlọ ikpe, ma tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere ha. [18] A ga-ekpe unu ikpe nꞌihu ndị na-achị achị na nꞌihu ndị eze nꞌihi m. Ma nke a ga-enye unu ohere ịgwa ha ihe banyere m. Ee, nke a ga-enyere unu ohere ịgba ama banyere m nye ndị ụwa. [19] “Mgbe ha jidere unu na-ekpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu. A ga-eme ka unu mata ihe unu ga-ekwu nꞌoge ahụ. [20] Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nꞌonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nꞌigwe ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu. [21] “Nwanne ga-agbagide nwanne ya ama, mee ka ọ nwụọ. Ndị bụ nna ga-ararakwa ụmụ ha nye. Ụmụ ga-ebili imegide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ. [22] Ụmụ mmadụ ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ma ndị nile ga-anọgide nꞌokwukwe ha ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
[8] Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ. [9] Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị. [10] O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile. [11] Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya na-abịa nso. Ya mere, sitenụ nꞌụra bilie! Ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Nꞌezie ọ dị nso karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. [12] Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ, mgbe Kraịst ga-alọghachi. Ya mere, wezuganụ ọrụ ọjọọ nile nke ọchịchịrị, yikwasịkwanụ onwe unu ihe agha nke ezi ndụ, ụdị nke ndị bi nꞌihè kwesịrị iyiri. [13] Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha. [14] Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu.
[28] Otu nꞌime ndị ozizi iwu bịara nꞌebe ahụ nꞌoge ha na-ekwu okwu ahụ, guzo gee ntị nꞌihe ha na-ekwu. Mgbe ọ hụrụ na Jisọs nyere ndị Sadusii ahụ ezi ọsịsa, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị, “Nꞌime iwu nile olee nke kachasị mkpa?” [29] Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu ahụ kwuru sị, ‘Geenụ ntị ndị Izirel! Onyenwe anyị bụ nanị otu Chineke. [30] Unu kwesịrị iji obi unu nile na mkpụrụ obi unu nile, na echiche obi unu nile, na ike unu nile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nꞌanya.’ [31] “Iwu ṅke abụọ, nke dịkwa mkpa, bụ nke sị, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.’ Iwu ọ bụla ọzọ adịghị nke karịrị ndị a mkpa.” [32] Nwoke ahụ zara sị, “Ị zara nke ọma mgbe i kwuru na Chineke bụ nanị otu, na e nweghị chi ọzọ di karịa ya. [33] Ị zakwara nke ọma mgbe ị zara na ịhụ ya nꞌanya dị mkpa karịa aja nsure ọkụ na onyinye ọchụchụ aja nile.” [34] Mgbe Jisọs hụrụ na nwoke a ghọtara ihe ndị a nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Mgbe nke a gasịrị, ọ dịkwaghị onye ọ bụla ọzọ nwere obi ike ịjụ ya ajụụ ọzọ.
“Ọ bụrụ na unu hụrụ m nꞌanya unu debe ihe nile m nyere unu nꞌiwu.
Nwoke ahụ jụrụ ya ajụjụ sị, “Olee iwu ndị m ga-edebe?” Jisọs zara sị ya, “Egbula mmadụ, akwala iko, ezula ohi, ekwula okwu ụgha.
Unu ga-anọgide nꞌịhụnanya m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. Mụ onwe m na-anọgidekwa nꞌịhụnanya nke Nna m nꞌihi na m naedebe ihe nile o nyere nꞌiwu.
“Unu echela na abịara m ịkagbu iwu Mosisi, ma ọ bụ ịkagbu ịdọ aka na ntị nke ndị amụma. Abịaghị m ịkagbu akagbu, kama abịara m imezu ha.
[12] Nke a bụkwa iwu m na-enye unu: hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya dị ka m siri hụ unu nꞌanya. [13] Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya. [14] Unu onwe unu bụkwa ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere unu nꞌiwu. [15] Malite ugbu a, agaghị m akpọkwa unu ndị ohu ọzọ. Nꞌihi na ohu adịghị amazu ihe nile onyenwe ya na-achọ ime. Ma ana m akpọ unu ndị enyi m nꞌihi na ihe nile Nna m naezube ka m gwara unu. [16] “Ọ bụkwaghị unu onwe unu họpụtara m. Ọ bụ m họpụtara unu ka unu baa nꞌime ụwa mịa mkpụrụ, mkpụrụ nke ga-adịgide. Ya mere, ọ bụrụ na unu arịọọ Nna m ihe ọ bụla site nꞌaha m, Nna m ga-enye unu ihe nile unu rịọrọ. [17] Ma nke a bụ iwu m nyere unu. Hụnụ onwe unu nꞌanya.
Igbo Bible 1988
No Data