Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Chineke: [Nkọcha]
Ugbu a Chineke nwere ike iji ngọzi ahụ o kwere Eberaham na nkwa gọziekwa ndị mba ọzọ. Anyị nile kwa, dị ka ndị Kraịst, nwere ike isite nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya nata Mmụọ Nsọ ahụ e kwere na nkwa.
“Ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.
Ugbu a, Kraịst emeela ka anyị pụọ nꞌohu. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu nọ dị ka ndị nwe onwe ha. Unu alaghachikwala azụ idebe iwu na omenala ndị Juu.
Ya mere, ọ bụrụ na e jikọtaa onye ọ bụla na Kraịst, onye ahụ abụrụla onye e kere ọhụrụ. Ọ bụkwaghị ụdị mmadụ ochie ọ bụ nꞌoge gara aga, nꞌihi na ndụ ochie agabigala, lee, ndụ ọhụrụ amalitela.
Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa.
[37] Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị. [38] Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke. [39] Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.
[8] Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi. [9] Guzosienụ ike nꞌokwukwe unu mgbe ọ ga-alụso unu ọgụ. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nꞌụdị ahụhụ a unu na-ahụ nꞌụwa nile.
[10] Tupu m mechie okwu m, achọrọ m ime ka unu cheta na ịdị ike unu kwesịrị ịbụ site nꞌike dị ukwuu nke Onyenwe anyị, onye nọ nꞌime unu. [11] Yikwasịnụ ngwa agha Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ nile nke ekwensu. [12] Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a. [13] Ya mere, yikwasịnụ ngwa agha nile nke Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike mgbe onye iro ahụ ga-alụso unu ọgụ. Ka unu nweekwa ike iguzo ọ bụladị mgbe unu chụghachiri ha azụ. [14] Ime nke a, meenụ ka eziokwu dịịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike. Ezi omume bụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu. [15] Meenụ ka njikere unu mgbe nile ikwusa ozi ọma nke udo bụrụ ihe dị ka akpụkpọ e yikwasịrị nꞌụkwụ unu. [16] Mgbe nile unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ akụ nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nꞌebe unu nọ. [17] Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.
Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.
Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere.
Igbo Bible 1988
No Data