Nꞌihi na unu maara ụdị oke ịhụnanya na obi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nꞌihi unu, ka unu onwe unu site nꞌogbenye ya bụrụ ọgaranya.
Enyi m, ana m ekpere gị ekpere mgbe nile na-arịọ Chineke ka o mee ka ihe na-agara gị nke ọma, ka ahụ sie gị ike, dị ka ihe si agara mkpụrụ obi gị nke ọma.
Ya mere, ka ike ghara ịgwụ anyị ime ihe ọma. Nꞌihi na mgbe e mesịrị, mgbe oge ya ruru, anyị ga-eweta ngọzi dị ukwuu dị ka ihe ubi, ma ọ bụrụ na anyị adaghị mba.
Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọ bụla, ọ bụladị iji eluigwe ma ọ bụ ụwa ṅụọ iyi. Kama ka “ee” unu bụrụ “ee”. Ka “é, è” unu bụrụkwa “é, è”. Ka unu hapụ isite nꞌụzọ dị otu a mehie wetakwara onwe unu ịbụ ọnụ Chineke.
Onye ọ bụla riri nri tutuu afọ eju ya. Emesịa, Jisọs nyekwara ndị na-eso ụzọ ya iwu sị, “Tụtụkọtaanụ ibiribe beredi na azụ fọdụrụ, ka ihe ọ bụla ghara ịla nꞌiyi.”
Mgbe ahụ Jisọs jiri ilu gwa ha okwu sị, “Onye ìsì enweghị ike idu onye ìsì ibe ya, nihi na ha abụọ ga-adaba nꞌime olulu.
nꞌihi na ọ bụ ebe ọ bụla ego unu dị ka obi unu ga-adịkwa.
Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị.
Ndị ndu kpuru ìsì! Unu na-azapụ ijiji site na mmanya unu na-aṅụ, ma unu na-eloda inyinya!
“Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’
Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ.
[22] Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Nweenụ okwukwe nꞌime Chineke. Nꞌihi na m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe nꞌime Chineke, unu pụrụ ịgwa ugwu olivu a okwu sị, [23] ‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya.
[6] Ma mgbe unu na-enye onyinye unu, achọrọ m ka unu cheta na nwoke ọ bụla na-akụ mkpụrụ ntakịrị, ga-aghọtakwa nke nta, ma onye ahụ na-akụ mkpụrụ buru ibu nꞌubi ya ga-aghọtakwa mkpụrụ hiri nne. [7] Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya. [8] Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma.
[28] Nꞌihi na ọ bụrụ na o cheghị echiche banyere nke a, o nwere ike wuruo nanị na ntọ ala ụlọ ahụ kwụsị, chọpụta na o jizughị ego ga-ezuru ya. Mgbe ahụ ọ bụrụ na ndị mmadụ esi ebe ahụ gafee hụ na o nweghị ike iwucha ụlọ ya, ha ga-ebido ịchị ya ọchị, na-asị, [29] “ ‘Leenụ kemgbe nwoke a bidoro iwu ụlọ a, ma o nwebeghị ime wuchaa ya.’ [30] “Ọ bụrụ na otu eze achọọ ịlụso eze ibe ya ọgụ, ọ gaghị eburu ụzọ chọpụta ma o nwere ike iji puku ndị agha iri lụso onye eze nke ọzọ ji iri puku ndị agha abụọ abịa ọgụ?
[34] “Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere. [35] “Ya mere, nweenụ obi ebere dị ka nna unu bi nꞌeluigwe si enwe obi ebere. [36] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpe unu ikpe. Amala ndị ozọ ikpe ka a ghara ima unu ikpe. Gbagharanụ ndị ọzọ, a ga-agbagharakwa unu.
[1] Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge ruola mgbe unu kwesịrị ịkwa akwa na ịsụ ude nꞌihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. [2] Akụ na ụba unu ebidola ịta ajarị, mkpu ebidokwala irichasị uwe ọma unu. [3] Ọlaọcha na ọlaedo unu ejupụtala nꞌịtarị. Ajarị a ga-abụkwa ama megide unu, ọ gaerepịa anụ ahụ unu dị ka ọkụ. Unu akpakọtaala akụ nꞌụbọchị ikpeazụ ndị a.
[1] “Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe. [2] Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha. [3] Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, mmenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime. [4] Chineke bụ Nna gị, onye maara ihe nzuzo nile, ga-akwụghachi gị ụgwọ zuru ezu. [5] “Mgbe ọ bụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ịhụ abụọ, ndị na-ekpe ekpere nꞌakụkụ ụzọ na nꞌime ụlọ ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha nụkwa ekpere ha, kwuo na ha bụ ndị dị nsọ. Nꞌezie, otuto a bụ nanị ụgwọ ọrụ ha ga-anata. [6] Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu. [7] “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu. [8] “Sinụ otu a kpee ekpere: Nna anyị nke bi nꞌeluigwe, ka e doo aha gị nsọ. [9] Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nꞌụwa, dị ka e si eme ya nꞌeluigwe. [10] Nye anyị nri nke ụbọchị taa. [11] Gbaghara anyị mmehie anyị, dị ka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị. [12] Edubala anyị nꞌime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị site nꞌọnwụnwa nke onye iro. Amin. [13] Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu. [14] “Banyere ibu ọnụ: mgbe unu na-ebu ọnụ, unu adịkwala ka ndị na-anwụ anwụ, ma ọ bụ dị ka ndị agụụ na-achọ ịgụgbu. Nke a bụ ihe ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-eme ka ihu ha zipụta na ha na-ebu ọnụ. Ka e site na nke a nwee ọmiko nꞌebe ha nọ. Nꞌezie, ọmiko ahụ ndị mmadụ nwere nꞌebe ha nọ bụ ụgwọ ọrụ ha. [15] Ma mgbe unu na-ebu ọnụ, dịnụ mma ile anya. [16] Ka mmadụ ọ bụla hapụ ịmata na unu na-ebu ọnụ. Nna unu, onye maara ihe nile, ga-akwụghachikwa unu ụgwọ. [17] “Unu akpadola akụ nꞌụwa nꞌihi na akụ a kpadoro nꞌụwa a pụrụ ịta ajarị, nla pụrụ iri ha, ndị ohi pụkwara izu ha. [18] Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa. [19] “Anya unu dị ka iheọkụ nke anụ ahụ unu. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, obi gị ga-ejupụta nꞌìhè. [20] Ma ọ bụrụ na echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ gị ekpuchie anya gị, gbochie ya ịbụrụ gị ìhè, ị ga-anọ nꞌọchịchịrị, ọchịchịrị ahụ ga-adịkwa ukwuu! [21] “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ. [22] “Nꞌihi nke a ka m ji na-asị unu, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ, ma ọ bụkwanụ uwe unu ga-eji kpuchie ahụ unu. Ndụ karịrị ihe e ji azụ ya. [23] Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha? [24] Ònye nꞌetiti unu pụrụ itinye otu nkeji nꞌogologo ụbọchị nke ndụ ya site nꞌichegbu onwe ya? [25] “Gịnị mekwaranụ unu ji na-anọ Hoge nile maka uwe? Leenụ okoko osisi ọhịa. Ha adịghị echegbu onwe ha maka uwe. [26] Ma asị m unu na ọ bụladị Solomọn nꞌoge ebube nke ịbụ eze ya nile, eyighị uwe ọ bụla dị mma dị ka okoko osisi ọhịa ndị a. [27] Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta? [28] “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi? [29] Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile. [30] Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ. [31] “Ya mere, unu echegbula onwe unu banyere ihe na-aga ime echi. Ọ bụrụ na Chineke emee ka ị dịrị ndụ taa, ọ ga-azụkwa gị echi. [32] “Unu ekpela ndị ọzọ ikpe, ka a ghara ikpekwa unu ikpe. [33] Nꞌihi na a ga-ekpe unu ikpe dị ka unu si kpee ndị ọzọ. Ihe i meere ndị ọzọ ka a ga-emekwara gị. [34] Gịnị mere i ji na-esogbu onwe gị banyere ntakịrị ahịhịa dị nwanne gị nꞌanya mgbe ahịhịa dị ukwuu karịa nke ya dị gị onwe gị nꞌanya?