Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya.
Lee ka Nna anyị bi nꞌeluigwe si hụ anyị nꞌanya, nꞌihi na o sitere nꞌamara ya mee ka a kpọọ anyị ụmụ ya. Nꞌezie, anyị bụkwa ụmụ Chineke. Ma ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ amaghị Chineke ha adịghị aghọta na anyị bụ ụmụ Chineke.
[7] Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. [8] Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya.
[16] Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. [17] Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya. [18] Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie. [19] Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya.
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galetia! Ònye bụ dibia ahụ tara ose gbụọ unu nꞌanya, ime ka unu gharakwa ịghọta ihe ọnwụ Kraịst pụtara, dị ka unu si ghọta ya mgbe m kọwaara unu ya na mbụ?
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.
Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya.
Ma lee ka ịhụnanya Chineke siri pụta ìhè! Mgbe anyị ka nọrị na-eme mmehie, Chineke zitere Kraịst ka ọ bịa nwụọ nꞌihi anyị.
[4] Ma ebere Chineke bara ụba nke ukwuu! Ịhụnanya ya nꞌebe anyị nọ dịkwa ukwuu! [5] Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị.
[6] Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu. [7] Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.
[37] Ma nꞌime ihe ndị a nile, mmeri bụ nke anyị site na Kraịst, onye ahụ hụrụ anyị nꞌanya, nwụọ nꞌihi anyị. [38] Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke. [39] Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.