Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ezigbo agwa: [Ile ọbịa] HIBRU 3:2Jisọs sitere nꞌaka Chineke nata nke a. Ọ rụkwara ọrụ ya dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihe nile e zitere ya ka o mee. Dị ka Jisọs, Mosisi bụkwa nwoke biri ndụ kwesịrị ntụkwasị obi.AISAIA 58:71 TIMỌTI 5:10Ọ ga-abụ onye mmadụ nile na-agbara ezi ama, nꞌihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nꞌụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, na onye jikeere mgbe nile ime ihe ọma.TAITỌS 1:8Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.1 PITA 4:8-9[8] Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie. [9] Jirinụ obi ọma na-elerita ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọ bụla. ỌLU OZI 16:33-34[33] Nꞌoge ahụ, ọ sara ọnya ha, nꞌebe e tichara ha ihe, ma merụọ ha ahụ. Emesịa, e mere ya na ezinụlọ ya baptizim. [34] Ọ kpọbatara ha nꞌụlọ ya, nye ha ihe oriri. Ya onwe ya na ezinụlọ ya ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ha kweere na Chineke. LEVITIKỌS 19:33-34LUK 14:7-14[7] Mgbe Jisọs hụrụ otu ndị a kpọrọ oriri ahụ si họrọ nanị oche dị mkpa, oche dị mkpa, ọ gwara ha okwu a nꞌilu sị. [8] “Ọ bụrụ na onye ọ bụla akpọọ gị oriri ọlụlụ nwụnye, abatala nọdụ nꞌoche dị mkpa, nꞌihi na ma eleghị anya, onye kpọrọ gị oriri kpọkwara ndị ọzọ dị mkpa karịa gị. [9] Nꞌihi na mgbe ndị e debeere oche ahụ dị mkpa bịara, onye kpọrọ gị oriri ga-abịakwute gị sị gị nye onyenwe oche ohere. Mgbe ahụ ị ga-ebili nꞌanya ihere gaa nọdụ nꞌoche dị ala. [10] “Kama mgbe ị batara, legharịa anya, nọdụ nꞌoche dị ala. Mgbe onye kpọrọ gị oriri bịara hụ gị, ọ ga-asị gị, ‘Enyi m, bịa nọdụ nꞌoche a dị mkpa e debeere gị.’ Nꞌoge ahụ ị ga-enwe ugwu nꞌanya ndị ọzọ a kpọrọ oriri ahụ. [11] Onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda ala, ma onye ọ bụla na-eweda onwe ya ala ka a ga-ebuli elu.” [12] Jisọs gwakwara onye ahụ kpọrọ ya oriri ahụ sị, “Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịkpọ oriri, akpọla nanị ndị enyi gị na ụmụnne gị na ndị ikwu gị na ndị ọgaranya, nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ndị a nanị ka ị kpọrọ, ha ga-akpọkwa gị nꞌoge nke ha. [13] Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ụkwụ rụrụ na ndị ngwụrọ na ndị ìsì. [14] Ebe ọ bụ na ndị a enweghị ike ịkwụghachi gị, Chineke ga-agọzi gị, kwụghachikwa gị, dị ka ọ ga-esi kwụghachi gị mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie.” MATIU 25:34-46[34] “Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa. [35] Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m. [36] *** [37] “Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị? [38] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe? [39] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’ [40] “Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ. [41] “Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. [42] Nꞌihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọ bụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ. [43] Mgbe m nọ dị ka ọbịa unu akpọbataghi m nꞌulo unu, mgbe m na-agba ọtọ unu enyeghị m uwe ka m kpuchie ọtọ m. Mgbe ahụ na-esighị m ike unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m. [44] “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ oge ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ oge ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ oge ị nọ nꞌọrịa, ma ọ bụ ị nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’ [45] “M ga-aza ha sị, eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nꞌime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ inyere aka. [46] “Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” ROM 12:13-20[13] Ọ bụrụ na ụmụnna unu nꞌime Kraịst anọọ na mkpa, meenụ ka ha keta oke nꞌihe unu nwere. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa nke ọma. [14] Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere. [15] Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soro ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nꞌakwa soro ha bee akwa. [16] Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile. [17] Bie ndụ ga-egosi ndị mmadụ na ị bụ onye Kraịst. Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. [18] Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo. [19] Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.” [20] Kama, ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie. Nye ya mmiri, ma ọ bụrụ na ọ chọọ ịṅụ mmiri. Nꞌịhi na ọ bụrụ na ị na-eme otu a, ọrụ ọma gị ga-eme ka ihere mee ya mgbe o chetara ihe ọjọọ o mere gị. Igbo Bible 1988 No Data