Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Ndụ: [Gbado anya]
Ma anyị nile ndị bụ ụmụ Chineke enweghị ihe mkpudo ọ bụla nꞌihu anyị. Anyị dị ka enyo na-egosi ndị mmadụ ebube Chineke. Mgbe Mmụọ Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ya nꞌime anyị, ọ na-agbanwe anyị, ime ka anyị dịrị ka ya.
Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.
Nꞌihi ya, kwadoonụ obi unu, nọọkwanụ na njikere dị ka ndị maara ihe ha na-eme. Tụkwasịkwanụ olileanya unu na ngọzi ahụ Chineke ga-enye unu, mgbe a ga-eme ka Jisọs Kraịst bịa ọzọ.
Hụrịtanụ onwe unu nꞌanya dị ka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụrụkwanụ ibe unu.
Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.
Ya mere ụmụnna m nꞌime Onyenwe anyị, unu ndị Chineke doro iche mee unu ndị nke ya na ndị ozi ya. Chineke emeela unu ndị ezinụlọ ya. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị ka unu cheta Jisọs Kraịst onye e mere onyeisi ozi nke Chineke, na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.
[1] Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu. [2] Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke.
Nọọnụ na njikere, na-echekwanụ nche nꞌihi na onye iro unu bụ ekwensu ji oke ịgbọ ụja na-awagharị dị ka ọdụm agụụ na-agụ na-achọ onye ọ ga-ala nꞌiyi.
Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile.
[4] Nꞌihi na ngwa agha anyị ji ebu agha, abụghị ngwa agha nke ụwa, kama ha bụ ngwa agha dị ike nke Chineke na-enye; ngwa agha ahụ anyị ji akwada nzube nile nke ekwensu wusiri ike, laa ya nꞌiyi. [5] Anyị na-eji ngwa agha ndị a emegide okwu ụgha nile na okwu nganga nile, nke ndị mmadụ na-eji ekpuchi eziokwu nile gbasara Chineke. Anyị na-ejikwa ngwa agha ndị a eme ka obi nile bụrụ ihe e meriri emeri irubere Kraịst isi.
[12] Anaghị m ekwu nꞌebe a na etozuola m, mara ihe nile. Amụtachabeghị m ihe nile m kwesịrị ịmụta. Kama ihe m na-eme bụ ịgbalịsị ike ịrụ ọrụ m na-aga nꞌihu, tutuu ruo ụbọchị ahụ m ga-abụ ihe ahụ nile Kraịst onye zọpụtara m, chọrọ ka m bụrụ. [13] Ụmụnna m, nꞌezie, abụbeghị m ihe ahụ m kwesịrị ịbụ. Ma ihe m ji ike m nile na-eme bụ ichefu ihe nile gara aga, na ilekwasị anya nꞌihe ahụ m na-agbaso dị m nꞌihu. [14] Ana m agbasi ọsọ ike ịga nꞌihu, iru na njedebe ebe ahụ a ga-agbaru ọsọ, ka m nwee ike inweta ihe ahụ a na-agbata nꞌọsọ, nke Chineke kwadebere inye ndị ya nꞌeluigwe, nꞌihi ọrụ zuru oke ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst rụrụ nꞌihi anyị.
Igbo Bible 1988
No Data