Mụ onwe m ga-abụ Nna unu, unu onwe unu ga-abụkwa ụmụ m ndị nwoke na ndị nwanyị.”
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa.
“Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.
[12] Ma ndị nile naara ya, ndị nile kweere nꞌaha ya, ka o nyere ike ịbụ ụmụ Chineke. [13] A mụghị ndị a kweere na ya site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, ma ọ bụ site nꞌọchịchọ nwoke, ma ọ bụ site na ntụpụta mmadụ, kama ịmụ ọzọ a sitere na Chineke nꞌonwe ya.
[4] Ma mgbe oge a kara aka ruru, oge ahụ Chineke kpebiri, o zitere Ọkpara ya, ka nwanyị mụọ ya dị ka onye Juu. [5] Chineke zitere ya ka ọ gbapụta anyị, ndị nọ nꞌokpuru iwu, ime anyị ndị a ga-agụ dị ka ụmụ Chineke nꞌezie.
[14] Nꞌihi na ndị nile Mmụọ Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke. [15] Anyị bụ ụmụ Chineke. O kwesịkwaghị ka anyị na-eme dị ka ndị ohu, ndị ụjọ na-atụ. A kpọbatala anyị nꞌezinụlọ Chineke. Ya mere, ka anyị kpaa agwa dị ka ụmụ Chineke. Ka anyị kpọọkwa Chineke “Nna, Nna” nꞌihi na ọ bụ Nna anyị. [16] Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie. [17] Ugbu a, ọ bụrụkwa na anyị bụ ụmụ ya, anyị gaeketa oke nꞌakụ ahụ dị nꞌalaeze Chineke. Nꞌihi na ihe nile Chineke nyere Jisọs abụrụla nke anyị. Ọ bụrụkwa nꞌezie na anyị ga-eso Kraịst keta oke nꞌotuto ya, anyị aghaghị iso ya keta oke na ntaramahụhụ ya.