Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ndụ: [Mgbu] JEREMAIA 29:11ABÙ ỌMA 34:18ABÙ ỌMA 147:3NKPUGHE 21:4Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”MATIU 4:23-25[23] Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche. [24] Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile. [25] Ọtụtụ mmadụ na-eso ya ebe nile ọ bụla ọ na-aga. Ndị sitere Galili, na Dekapolis, na Jerusalem, na Judia, na ọ bụladị nꞌofe osimiri Jọdan, bịara soro ya. ABÙ ỌMA 23:1-62 KỌRINT 1:3-8[3] Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa. [4] Ọ na-enyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị nile, ka anyị site nꞌụzọ dị otu a nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na nsogbu dị iche iche aka. Inyere ha aka dị ka anyị onwe anyị si nata inyeaka site nꞌaka Chineke. [5] Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst. [6] Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa. [7] Anyị nwere olileanya na ọ bụrụ na unu enwee nsogbu dị ka anyị nwere, Chineke ga-akasị unu obi, ma nyekwara unu aka dị ka o si nyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị. [8] Anyị chọrọ ka unu mara ụmụnna m, ihe banyere nsogbu e sogburu anyị nꞌEsia. Nꞌezie, nsogbu ahụ karịrị anyị ike, mee ka anyị hapụ inwekwa olileanya na anyị ga-emesị dịrị ndụ. 1 PITA 4:12-19[12] Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ. [13] Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè. [14] Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe ọ bụla a na-abụ unu ọnụ, ma ọ bụ na-ekwutọ unu, nꞌihi na unu bụ ndị na-eso Kraịst. Nke a na-ezipụta na Mmụọ ahụ dị ebube, Mmụọ Chineke, bi nꞌime unu. [15] Ka onye ọ bụla nꞌime unu ghara ịta ahụhụ nꞌihi na o gburu mmadụ ma ọ bụ dị ka onye ohi, ma ọ bụ dị ka onye na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ dị ka onye na-anara mmadụ ihe nꞌaka ike. [16] Ma ihere ekwesịghị ime unu mgbe unu na-ata ahụhụ dị ka ndị Kraịst. Kama nyenụ Chineke ekele na a na-akpọ unu ndị Kraịst. [17] Nꞌihi na oge ikpe ikpe eruola, ọ ga-amalịtekwa nꞌebe ndị Chineke nọ. Ọ̀ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwereghị na Kraịst? [18] Ọ̀ bụrụ na ọ ga-esi ike ịzọpụta ndị ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie? [19] Ya mere, ọ bụrụ na unu na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, gaanụ nꞌihu na-eme ihe ziri ezi. Nyefeekwanụ onwe unu nꞌaka Chineke onye kere unu, onye kwesịrị ntụkwasị obi. JỌN 16:16-24[16] Ọ fọdụrụ nwa oge ugbu a unu agaghị ahụkwa m anya ọzọ. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ. Nke a bụ nꞌihi na ana m alakwuru Nna m.” [17] Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị ka okwu dị otu a pụtara? Gịnị ka o bu nꞌobi mgbe ọ na-asị, ‘Ana m alakwuru Nna m?’ Nke a edoghị anyị anya.” [18] Ndị ọzọ sịkwara, “Gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, ‘Ọ̀ fọdụrụ nwantịị unu agaghị ahụ m anya ọzọ ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, unu ga-ahụkwa m anya?’ ” [19] Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru? [20] Nꞌezie, unu ga-akwa akwa tie aka nꞌobi na mwute. Ma ndị ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma mgbe iru uju unu gafesịrị unu ga-aṅụrị ọṅụ. [21] Mgbe nwanyị dị ime na-achọ ịmụ nwa, ọ naanọ nꞌọnọdụ mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nꞌihi na ọ mụpụtala nwa nwoke ya. [22] Unu nọ nꞌọnọdụ iru uju ugbu a. Ma mgbe nwantịntị oge gasịrị, aga m ahụ unu anya ọzọ. Mgbe ahụ unu ga-aṅụrị ọṅụ. Mmadụ ọ bụla apụkwaghị ịnapụ unu ọṅụ unu mgbe ahụ. [23] Mgbe ụbọchị ahụ ga-erukwa, ọ dịghị ihe ga-adị unu mkpa. Ọ dịkwaghị ihe unu ga-arịọ nꞌaka m. Unu ga-ajụ Nna m ihe nile. Ọ ga-enyekwa unu nꞌihi na unu na-arịọ ha nꞌaha m. [24] Ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nꞌaha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka ọṅụ unu zuokwa oke. HIBRU 12:1-11[1] Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu. [2] Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke. [3] Na-atụgharịnụ uche nꞌihe banyere Jisọs oge nile. Tụgharịanụ uche banyere mmeso o mesoro ndị mmehie ahụ megidere ya. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịda mba nꞌọsọ unu na-agba. [4] Chetanụ na mmadụ ọ bụla anwụbeghị nꞌetiti unu nꞌihi ọgụ nke unu na-alụso mmehie. [5] Unu echefuola ihe akwụwkọ nsọ kwuru? Nꞌime ya ka Chineke na-agwa unu okwu dị ka ụmụ sị: “Nwa m ewela iwe mgbe Chineke na-apịa gị ụtarị. Adala mba mgbe ọ na-egosi gị ụzọ i siri mejọọ. [6] Nꞌihi na onye Chineke hụrụ nꞌanya ka ọ na-abara mba. Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị.” [7] Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. [8] Ya mere ọ bụrụ na Chineke adịghị abara unu mba mgbe unu na-enupụ isi nꞌiwu ya, unu abụghị ụmụ ya. Unu enwekwaghị oke nꞌezinụlọ ya. Nꞌihi na ụmụ ya nile ka ọ na-abara mba. [9] Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma. [10] Ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-azụ anyị nwa oge nta dị ka ha si tụpụta nꞌuche ha. Ma Chineke na-azụ anyị nꞌihi ọdịmma anyị. Ọ na-achọ ka anyị keta oke nꞌịdị nsọ ya. [11] Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a. ROM 8:18-28[18] Nꞌikwu eziokwu, ahụhụ nile anyị na-ata ugbu a erughị ihe a ga-eji tụnyere ngọzi nile Chineke gaje inye anyị. [19] Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya. [20] Nꞌihi na Chineke bụrụ ihe nile o kere eke ọnụ, ọ bụghị nꞌihi na ihe ndị a chọrọ ịnọ ọnọdụ a, kama, ọ bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka o si otu ahụ dịrị. Ma otu ọ dị, ihe ndị a nile nwere olileanya na, [21] otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-azọpụta ha site nꞌaka ịbụ ohu nke ire ure, mee ka ha soro ụmụ Chineke nile nwere onwe ha, sorokwa ha keta oke nꞌebube ahụ ga-abụ nke ha. [22] Anyị maara na tutuu ruo ugbu a, ihe nile e kere eke, dị ka ụmụ anụmanụ, na ahihia, nọ na-asụ ude, nꞌihi ihe mgbu ha nọ nꞌime ya. Ma ha nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ. [23] Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ. [24] A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a. [25] Ọ bụrụkwa na anyị nwere olileanya na ọ dị ihe Chineke ga-emere anyị, anyị kwesịrị iji ndidi chere ruo mgbe o mezuru ihe ahụ. [26] Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ. [27] Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ. [28] Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị. ABÙ ỌMA 91:1-16 Igbo Bible 1988 No Data