Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ndụ: [Mmekọahụ] 2 KỌRINT 12:21Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.EFESỌS 5:3Ka ahapụ ịkọta akụkọ mmehie ịkwa iko, ma ọ bụ nke adịghị ọcha, ma ọ bụ nke inwe anya ukwu nꞌebe ihe ndị ọzọ nꞌetiti unu nwere dị. Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ya, nꞌihi na omume ọjọọ dị otu a ekwesịghị ụmụ Chineke.EFESỌS 5:33Ya mere, ọ dị mkpa na nwoke ga-ahụ nwụnye ya nꞌanya dị ka onwe ya. Nwanyị ọ bụla kwesịkwara ịsọpụrụ di ya.GALETIA 5:19Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.JENESIS 2:24HIBRU 13:4Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha.1 KỌRINT 6:9Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko,1 KỌRINT 6:18Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.1 JỌN 1:9Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.MATIU 5:28Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.MAK 7:22-23[22] na ịchị ịdọtara onwe gị ihe ndị ọzọ nwere, na ekworo, na aghụghọ nile, na adịghị ọcha nile, na inwe anya ụfụ nꞌebe ndị ọzọ nọ, na nkwulu nile, na nganga, ya na enweghị uche ọ bụla. [23] Ihe ọjọọ ndị a nile na-esite nꞌime mmadụ pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.” 1 TESALỌNAIKA 4:3-5[3] Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ. [4] *** [5] Ọ bụghị nꞌụzọ imejupụta ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme, nꞌihi enweghị nghọta ha banyere ihe bụ ụzọ Chineke chọrọ ka ha gbasoo. MAK 10:6-9[6] Na mbụ, mgbe Chineke kere nwoke na nwanyị, o sighị otu a dịrị. Chineke mere nwoke na nwanyị ka e jikọtaa ha nꞌotu, ka ha abụọ bụrụ otu nꞌọlụlụ di na nwụnye. [7] Nꞌihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, ka e jikọtaa ya na nwụnye ya. [8] Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ. Mgbe ahụ ha agaghị abụkwa mmadụ abụọ, kama ha ga-abụ otu. [9] Ya mere, ihe ọ bụla Chineke jikọtara, ka mmadụ ọ bụla hapụ ịtọsa ya.” ILU 5:15-191 KỌRINT 13:4-8[4] Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu. [5] Onye hụrụ mmadụ ibe ya nꞌanya anaghị akpasu ya iwe, ọ naghị achọ ihe nke nanị ya, ọ naghị ewe iwe ọsịịsọ. Ọ nakwaghị agụkọ ihe ọjọọ nile e mere ya. [6] Ịhụnanya adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌihe ọjọọ, ọ hụrụ eziokwu nꞌanya. [7] Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta. [8] Ịhụnanya adịghị agwụ agwụ. Ma ibu amụma nile ga-emesịa kwụsị, onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche ga-akwụsịkwa. Otu a, ihe ọmụma nile ga-agabiga. ABÙ NKE ABÙ 7:6-121 KỌRINT 6:13-20[13] Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ. [14] Dị ka Chineke si site nꞌike ya mee ka Onyenwe anyị site nꞌọnwụ bilie, otu ahụ kwa ka ọ ga-esitekwa nꞌike ya mee ka anyị si nꞌọnwụ bilie. [15] Ọ̀ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ akụkụ ahụ Kraịst? Ọ̀ dị mma na m ga-eji ahụ Kraịst mee ka e jikọtaa ya na ahụ nwanyị akwụla? Tụfiaa! Chineke ekwela. [16] Ọ̀ bụ na unu amataghị na nwoke ọ bụla ya na nwanyị akwụla nwere mmekọrịta esorola nwanyị ahụ bụrụ otu anụ ahụ? Nꞌihi na e kwuru ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” [17] Ma ọ bụrụ na e jikọtaa mmadụ ọ bụla na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nꞌime mmụọ. [18] Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya. [19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke. [20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto. Igbo Bible 1988 No Data