Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Ndụ: [Mma]
[3] Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla. [4] Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke.
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.
Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile.
Ugbu a ụmụnna m, tupu m mechie, achọrọ m ịgwa unu otu ihe a, na-echenụ echiche mgbe nile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. Na-echekwanụ echiche banyere ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, ihe ọ bụla dị mma na ndụ onye ọ bụla nke e kwesịrị ịṅomi, na nke e kwesịrị inwe otuto nꞌihi ya.
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo.
[28] “Nꞌihi nke a, unu echegbula onwe unu na-asị, gịnị ka anyị ga-eri? Gịnị ka anyị ga-aṅụ? Gịnịkwa ka anyị ga-eyi? [29] Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.
[9] Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma. [10] Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.
[26] Anyị nile kwa, ndị e sitere na baptizim e mere anyị, mee ka e jikọta anyị na Kraịst nꞌotu, abụrụla ndị e ji ọdịdị Kraịst kpuchie. [27] Ọ dịkwaghị ihe dị iche ugbu a. Nkewa ọ bụla adịkwaghị. A naghị ahụkwa anyị dị ka ndị Juu, ma ọ bụ ndị Griik, ma ọ bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nwere onwe ha, ma ọ bụkwanụ ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị, kama anyị nile bụ ndị nke Kraịst, ndị e jikọtara nꞌotu nꞌime Kraịst Jisọs.
Nꞌihi na onye ọ bụla na-ege ntị nꞌokwu ọ bụla ma hapụ iji ihe ọ nụrụ mee ihe, dị ka nwoke na-ele ihu ya nꞌenyo.
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-ewu ili ndị amụma ahụ nna unu ha gburu, na-atụkwasị okoko osisi nꞌili ahụ e liri ndị ezi omume ahụ nna unu ha gburu.
Igbo Bible 1988
No Data