Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Ihe omimi: [Ndị ọbịa]
Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.
Matakwanụ ugbu a na unu abụkwaghị ndị mba ọzọ na ndị ọbịa. Unu esorola ụmụ Chineke nile bụrụ diala nꞌezinụlọ Chineke.
Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.
Ndị a nile bụ ndị nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ma ha nwụrụ na-ele anya nkwa Chineke kwere ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi nke a, na-aghọtakwa na ha bụ ndị ọbịa nꞌụwa.
Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nꞌihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka ha lekọtara.
Ka ndụ unu na-ebi nꞌetiti ndị na-amaghị Chineke bụrụ ihe e ji ama atụ. Ọ bụ nke a ga-eme ka ha ghara inwe ọnụ, ọ bụladị mgbe ha chọrọ ikwutọ unu. Ndụ unu na ọrụ ọma unu ga-eme ka ha ghọta ma tookwa Chineke nꞌụbọchị Kraịst ga-alọghachi.
Nꞌikpeazụ, onye na-elekọta obodo, kwụsịrị ha nꞌụzụ a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ndị ikom Efesọs, onye ọ bụla maara na obodo Efesọs bụ obodo a maara aha ya nꞌihi chi anyị a na-akpọ Daịana onye oyiyi ya si nꞌeluigwe daara anyị.
Ṅụrịanụ ọṅụ ndị nile bi nꞌeluigwe. Unu ụmụ nke eluigwe ṅụrịanụ. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nꞌụwa, nꞌihi na ekwensu ejirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge o nwere ehighị nne.”
Mgbe ahụ, ahụrụ m otu anụ ọhia buru ibu, ka o si nꞌime oke osimiri na-arịpụta. Anụ ọhia a nwere isi asaa na mpi iri. Okpu eze iri dịkwa nꞌelu mpi ndị a. Aha e dekwasịrị nꞌisi asaa ahụ nꞌotu nꞌotu bụ aha ikwutọ na ikwuhie Chineke.
[7] Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka inyinya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpu eze e ji ọlaedo kpụọ nꞌisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ. [8] Agịrị isi ha dị ogologo dị ka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze dị ha nꞌọnụ dịkwa ka eze ọdụm. [9] Ha yikwasịrị onwe ha ihe mgbochi obi e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ a na-anụ mgbe ụsụ ndị agha na-aga ibu agha. [10] Ha nwere ọdụdụ na-agba agba dị ka akpị. Ma ike nile e nyere ha imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise dị nꞌọdụdụ ha. [11] Onye ahụ na-achịkọta ha bụ eze olulu ahụ omimi ya na-enweghị nsọtụ. Aha ya nꞌasụsụ Hiburu bụ Abadọn. Nꞌasụsụ Griik a na-akpọ ya Apọliọn. (Ma nꞌasụsụ Igbọ a ga-akpọ ya Onye mmebi.)
Igbo Bible 1988
No Data