Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Ihe omimi: [Akara Aka]
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”
Mgbe ahụ ahụrụ m ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha guzo nꞌihu Chineke. E meghere akwụkwọ, megheekwa akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ. E sitekwara nꞌihe nile e dere nꞌakwụkwọ ahụ kpee ndị a nile nwụrụ anwụ ikpe, dị ka ọrụ ha rụrụ si dị.
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.
[28] Anyị makwaara na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya, na-emekwa ihe ọ na-achọ, ka ha ha, bụ ihe nile na-adakwasị anyị nꞌọnọdụ ọ bụla, bụ ihe Chineke ji na-arụ ọrụ, ịrụpụta ezi ihe na ndụ anyị. [29] Nꞌihi na site na mmalite ihe nile, Chineke maararị ndị ga-abịakwute ya. O kpebikwara na ndị a ga-abịakwute ya ga-adị ka Ọkpara ya Jisọs Kraịst, ka Jisọs bụrụ onye okenye e bu ụzọ mụọ nꞌetiti ọtụtụ ụmụnna.
[8] Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke! [9] Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.
[8] Ma unu abụghị ndị ahụ ga-ada ada. Kama unu bụ agbụrụ Chineke ji aka ya họpụta. Unu bụ ndị nchụaja onye eze ahụ. Unu bụ ndị dị nsọ, ndị nke Chineke nꞌonwe ya. Unu bụ ndị a họpụtara ka ha kwusaa ọrụ ebube Chineke, onye ahụ si nꞌọchịchịrị kpọbata unu nꞌime ìhè ya. [9] Nꞌoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mgbe ochie, unu amaghị ihe ọ bụla banyere obi ebere Chineke, ma ugbu a obi ebere ya erutela unu aka.
[7] Kama okwu anyị na-ekwusa bụ okwu amamihe, nꞌihi na o si nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ okwu nke na-akọwa nzube zoro ezo nke Chineke, nzube ahụ Chineke zubere tupuu o kee ụwa, iwebata anyị nꞌotuto ya nꞌeluigwe. [8] Ọ dịghị ọkachamara ọ bụla nọ nꞌụwa a maara ihe banyere nzube a. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nꞌobe. [9] Ọ bụ ihe a ka e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ndị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nꞌobi ya, na ọ bụ ihe ga-eme, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị nile hụrụ ya nꞌanya.”
Igbo Bible 1988
No Data