Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Mmehie: [Ụ ọgwụ ọjọọ]
[13] Bikonụ ụmụnna m, gbaaranụ ife arụsị ọ bụla ọsọ. [14] Dị ka ndị nwere uche nke unu bụ, leenụ ihe ndị a anya matakwanụ ma ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu.
Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa.
Unu ekwela ka e duhie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu egee ndị na-ekwu ụdị okwu ahụ ntị, unu ga-ebido na-akpa agwa dị ka ha.
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ.
Enwere m ike ime ihe nile m maara na m kwesịrị ime, ma ọ bụghị ihe nile ga-abara m uru. Ọ bụrụ na iwu ọ bụla ejighị m ma m mee ihe ọ bụla m kwesịrị ime, agaghị m eme ihe ọ bụla m maara na emesịa, agaghị m enwe ike ịkwụsị ime ya maa m kpebie ịhapụ ime ya.
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.
[3] Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi. [4] Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike. [5] Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.
[9] Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a enweghị oke ọ bụla nꞌalaeze Chineke? Kwụsịnụ iduhie onwe unu. Nꞌihi na ndị nile na-akwa iko, ndị na-efe arụsị, ndị ikom nwere nwụnye na-akwa iko, ndị ikom na-eji ndị ikom ibe ha akwa iko, [10] ndị nile na-ezu ohi, ndị anya ukwu, ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe ha nwere, agaghị eketa oke nꞌalaeze Chineke. [11] Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.
Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile.
[2] Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu. [3] Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.
[15] Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya. [16] Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.
[16] Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. [17] Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.
Nꞌihi na apụrụ m ime ihe nile site nꞌinyeaka Kraịst onye na-enye m ike.
Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu.
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.”
Igbo Bible 1988
No Data