Isiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Mmehie: [Anyaukwu] 1 JỌN 2:16Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa.2 KỌRINT 9:7Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya.EKLISIASTIS 5:10HIBRU 13:5Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.”LUK 12:15Mgbe ahụ Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Kpachapụnụ anya, nꞌihi na ndụ mmadụ adabereghị nanị nꞌihe o nwere, ma ọ bụ otu onye ahụ siri baa ụba.”MATIU 6:24“Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ife nna ukwu abụọ, nꞌihi na ọ ghaghị ịhụ otu nꞌime ha nꞌanya, kpọọkwa nke ọzọ asị. Otu a kwa i nweghị ike ife Chineke na ego otu mgbe ahụ.ILU 11:28ILU 13:11ILU 14:31ILU 15:27ILU 20:21ILU 22:1-9ILU 28:22-251 PITA 5:2-3[2] Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi. [3] Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha. 1 KỌRINT 4:11-13[11] Tutuu ruo ugbu a anyị na-ebu ọnụ nꞌihi ahụghị ihe anyị ga-eri. Anyị na-ejegharị na-arụ ọrụ nꞌọnọdụ akpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị. [12] Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi. [13] Anyị na-eji okwu dị nro na-azaghachi ndị na-ekwujọ anyị. Tutuu ruo ugbu a a na-emeso anyị mmeso dị ka anyị bụ unyi ndị ụwa na-azachapụ, dị ka ihe a jụrụ ajụ nꞌanya ndị ụwa. 1 TIMỌTI 6:6-19[6] Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe. [7] Nꞌihi na anyị ejighị ihe ọ bụla mgbe anyị na-abịa nꞌime ụwa a, otu aka ahụ, anyị agaghị ejikwa ọ bụladị otu kobo si nꞌime ya pụọ mgbe anyị nwụrụ. [8] Nꞌihi nke a o kwesịrị ka afọ ju anyị nꞌihe anyị nwere, ma ọ bụrụ na anyị enwee nanị ihe anyị ga-eri na uwe anyị ga-eyi. [9] Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ. [10] Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju. [11] Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ. [12] Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama. [13] Ana m enye gị iwu nꞌihu Chineke, onye na-enye mmadụ nile ndụ, na nꞌihu Kraịst Jisọs onye gbasiri ama ike nꞌihu Pailet na-atụghị ụjọ. [14] Ka i debezuo ihe nile Chineke nyere gị nꞌiwu idebe. Ka onye ọ bụla ghara ịchọpụta ntụpọ ọ bụla nꞌime gị, site ugbu a ruo mgbe Kraịst ga-abịaghachi ọzọ. [15] Nꞌihi na mgbe oge ahụ ruru, Chineke onye a gọziri agọzi na onye nanị ya bụ Chineke dị ike, eze kachasị eze nile na onye kachasị ndị nwe mmadụ nile ga-eme ka Kraịst pụta ìhè site nꞌeluigwe. [16] Chineke bụ onye nanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebi nꞌime ìhè, nke mmadụ ọ bụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọ bụla na-ahụbeghị anya mgbe ọ bụla, onye a na-apụkwaghị ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amin. [17] Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile. [18] Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha. [19] Mgbe ha na-eme ihe ndị a ha na-akpata akụ nke ha naedebe nꞌụlọ akụ nke eluigwe. Nke a bụkwa nanị akụ anyị nwere ike ịkpado nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-abụkwara anyị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ juru afọ nꞌụwa a. JEMES 5:1-6[1] Ugbu a geenụ ntị unu ndị ọgaranya, oge ruola mgbe unu kwesịrị ịkwa akwa na ịsụ ude nꞌihi nsogbu na-akwado ịbịakwasị unu. [2] Akụ na ụba unu ebidola ịta ajarị, mkpu ebidokwala irichasị uwe ọma unu. [3] Ọlaọcha na ọlaedo unu ejupụtala nꞌịtarị. Ajarị a ga-abụkwa ama megide unu, ọ gaerepịa anụ ahụ unu dị ka ọkụ. Unu akpakọtaala akụ nꞌụbọchị ikpeazụ ndị a. [4] Geenụ ntị! Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu jụrụ ịkwụ ụgwọ ọrụ ha dị ka o kwesịrị na-agbago imegide unu. Ụzụ akwa ndị ọrụ unu, ndị unu ghọgburu, eruola ntị Onyenwe anyị bụ Onye pụrụ ime ihe nile. [5] Unu ebiela ndụ nke oke oriri na oke ọṅụṅụ, ndụ inye anụ ahụ unu ihe ọ bụla na-akpa ya mkpa. Ma ugbu a anụ ahụ unu ahụ gbara abụba ejikerela na-eche ikpe nke na-abịa. [6] Unu amaala ndị aka ha dị ọcha ikpe ọmụma, gbuokwa ha, ọ bụladị mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ ha bu nꞌobi ha megide unu. Igbo Bible 1988 No Data