Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta.
Ka okwu unu na-ekwu bụrụ nke na-atọ ụtọ na ntị. Mụtakwanụ otu e si enye mmadụ ọsịsa dị mma.
Ka okwu rere ure ọ bụla hapụ isite nꞌọnụ unu pụta. Kama kwuonụ okwu ga-abara ndị ọzọ uru na nke ga-enyere ha aka. Ụdị okwu pụrụ iwuli ndị ọzọ elu na iwetara ha ngọzi.
Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ okwu nzuzu. Kama werenụ oge unu gwarịtaa onwe unu ihe banyere ịdị mma Chineke. Werekwanụ oge unu kelee Chineke ekele.
Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.
Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị!
[5] Otu a ka ọ dịkwa ire anyị. Ọ bụ akụkụ anụ ahụ anyị dị nta, ma ọ na-anya isi banyere ọtụtụ ihe. Kwụsịdị chee echiche ụdị ọhia nke icheku ọkụ ntakịrị pụrụ ime ka o nwuru ọkụ. [6] Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị. [7] Mmadụ enweela ike zụọ, na-agbalịkwa ịzụ anụmanụ dị iche iche, na anụ na-akpụ akpụ, na anụ bi na mmiri, [8] ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya. [9] Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya. [10] Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị! [11] Ọ̀ bụ ihe pụrụ ime na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ na mmiri nnu ga-esite nꞌotu isi iyi ahụ na-asọpụta? [12] Ụmụnna m, osisi oroma ọ̀ pụrụ ịmụ ube? Ka osisi ube ọ pụrụ ịmịpụta oroma? Nꞌụzọ dị otu a anyị makwaara na mmiri nnu na mmiri dị mma ịṅụ aṅụ apụghị isite nꞌotu isi iyi asọpụta.
“Ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti gị nke ọzọ. Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anara gị uwe ahụ gị, nyekwa ya uwe ime ahụ gị.
Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ dị ụtọ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ọma ahụ anya, ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha.
Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere.
[10] Mgbe ahụ, Jisọs kpọrọ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Geenụ ntị nꞌihe m na-ekwu. Ghọtakwanụ okwu m! [11] Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”
[8] ma mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịzụ ire ya. [9] Ọ bụ ire anyị ka anyị ji eto Chineke bụ Onyenwe anyị na Nna anyị. Ọ bụkwa ire anyị ka anyị ji abụ mmadụ ibe anyị ọnụ, bụ ndị Chineke mere nꞌoyiyi nke ya. [10] Site nꞌotu ọnụ anyị ka ija mma na ịbụ ọnụ na-esi apụta. Ụmụnna m, nke a ọ̀ bụ ihe ziri ezi? Ọ dịghị!
[18] Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ. [19] Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ. [20] Ihe ndị a bụ ihe na-emerụ mmadụ, ọ bụghị ma mmadụ kwọrọ aka tupuu o rie nri, ma ọ bụ na ọ kwọghị.”