N'ihi na oge nke gasiworo ezuwo iluputa ihe ndi mba ọzọ nēzube, na ijeghari nime agu ikwa-iko, agu ihe ọjọ nile, manya-ob͕ub͕u nile, ite-egwú nile, iṅubiga-manya-ókè nile, na ikpere-arusi nile jọb͕uru onwe-ha:
Abu-kwa-la onye nāṅu nání miri ọzọ, kama nāṅu nwantinti manya-vine n'ihi afọ-gi na nriaria nke nāria gi ọtutu mb͕e.
Je, were ọṅù rie nri-gi, were kwa obi di nma ṅua manya-vine-gi; n'ihi na ọlu-gi nile atọwo Chineke utọ na mb͕e di anya gara aga.
Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ;
Onye nākwa emò ka manya-vine bu, onye-nkpọtu ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya bu; Onye ọ bula nke nāwaghari site na ya amaghi ihe.
Elekwasila manya-vine anya mb͕e ọ nācha ọbara-ọbara, Mb͕e ọ nēnye udi-ya n'iko, Mb͕e ọ nāsughari n'iko nke-ọma:
[4] Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di? [5] Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.
Ka ayi nējeghari dika ọ kwesiri ayi, dika n'ehihie; ọ bughi n'ite-egwú na iṅubiga-manya-ókè, ọ bughi n'ikwa-iko na agu ikwa-iko, ọ bughi n'esem-okwu na ekworo.
[14] I bu Onye nēme ka ahihia puere anu-ulo Nēme kwa ka ihe akuru n'ala puere ọlu-ubi madu; Ime ka nri si n'ala puta: [15] Na manya-vine nke nēme ka obi madu ṅuria, Ime ka iru-ya nēb͕upu site na manu, Na achicha nke nēme ka madu nwe ume n'obi.
[4] Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di? [5] Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala.
[8] Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N'ezie M'gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n'ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu bayere ya: [9] kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.
[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko, [20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù, [21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.
[23] Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile bara urù. Ihe nile ziri ezi n'iwu; ma ọ bughi ihe nile nēwuli madu elu dika ulo. [24] Ka onye ọ bula ghara ichọ ọdi-nma nke aka ya, kama ọdi-nma nke madu-ibe-ya.
[8] Jehova ewerewo aka-nri-Ya, were kwa ogwe-aka-Ya di ike, ṅua iyi, si, N'ezie M'gaghi-enye kwa ọka-gi ọzọ iburu ndi-iro-gi ihe-oriri ma-ọli; n'ezie umu ala ọzọ agaghi-aṅu kwa manya-vine ọhu gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu bayere ya: [9] kama ndi chikọtaworo ya gēri ya, we to Jehova; ndi kpokọtaworo ya gāṅu kwa ya n'ogige nsọm nile.
[19] Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko, [20] ikpere-arusi, igwọ-ńsí, ibu-iro, esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkewa, irọ-òtù, [21] ikpọ-asì, iṅubiga-manya-ókè, ite-egwú, na ihe yiri ihe ndia: nke m'buru uzọ gwa unu, dika m'buru uzọ gwa unu n'oge gara aga, na ndi nēme ihe di otú a agaghi-eketa ala-eze Chineke.
[19] N'ihi na ọ bu ezie na enwerem onwem n'ebe madu nile nọ, ma emerem onwem ka m'buru orù madu nile, ka m'we rita ọtutu madu n'urù kari. [20] N'ebe ndi-Ju nọ m'we di ka onye-Ju, ka m'we rita ndi-Ju n'urù; n'ebe ndi nọ n'okpuru iwu di m'we di ka onye nọ n'okpuru iwu, ọ bughi na mu onwem nọ n'okpuru iwu, ka m'we rita ndi nọ n'okpuru iwu n'urù; [21] n'ebe ndi nēnweghi iwu nọ m'we di ka onye nēnweghi iwu, ọ bughi na enweghm iwu n'ebe Chineke nọ, kama anọm n'okpuru iwu n'ebe Kraist nọ, ka m'we rita ndi nēnweghi iwu n'urù. [22] N'ebe ndi nādighi ike nọ m'ghọrọ onye nādighi ike, ka m'we rita ndi nādighi ike n'urù: aghọwom ihe nile n'ebe madu nile nọ, ka m'we si n'uzọ ọ bula zọputa ufọdu. [23] Ma anameme ihe nile n'ihi ozi ọma, ka m'we ghọ onye nēnwekọ ya.
[15] N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya. [16] Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu: [17] n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ. [18] N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu. [19] Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo. [20] Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya. [21] Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya.
[3] Mb͕e manya-vine kọrọ, nne Jisus we si Ya, Ha enweghi manya-vine. [4] Jisus we si ya, Nwanyi, gini ka Mu na gi nwekọrọ? oge hour nkem akābiarughi. [5] Nne-Ya si ndi nēje ozi, Ihe ọ bula Ọ si unu me, menu ya. [6] Ma adọbara n'ebe ahu ite nkume miri isi, dika ime-ọcha nke ndi-Ju si di, nānagide firkin abua ma-ọbu atọ n'otù. [7] Jisus si ha, Were miri b͕ajue ite-miri ndia. Ha we b͕ajupu ha n'ọnu. [8] O we si ha, Kuputanu ub͕u a, bugara onye-isi oriri. Ha we būru ya. [9] Ma mb͕e onye-isi oriri ahu deturu miri ahu ọnu nke ghọrọri manya-vine, ma ọ mataghi ebe o si puta (ma ndi nēje ozi ndi kuputarari miri ahu mara), onye-isi oriri ahu we kpọ onye nālu nwunye ọhu, [10] si ya, Onye ọ bula nēbu uzọ adọba manya-vine ọma; mb͕e ọ bula madu ṅubigasiri manya ókè o we dọba nke jọkariri njọ: gi onwe-gi edebewo manya-vine ọma rue ub͕u a. [11] Jisus mere nmalite ihe-iriba-ama-Ya nile nka na Kena nke Galili, we me ka ebube-Ya puta ìhè; ndi nēso uzọ-Ya we kwere na Ya.