Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Chineke: [Nkọcha]
N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.
Ma ọ gēru, ọ buru na i geghi nti olu Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta; na nkọcha nile ndia gābiakwasi gi, we rue gi aru.
Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.
Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.
Kraist b͕aputara ayi n'ọbubu-ọnu nke iwu ahu, ebe Ọ ghọrọ ọbubu-ọnu n'ọnọdu-ayi: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anabu ọnu ka ọ bu, bú onye ọ bula nke anākwuba n'elu osisi:
Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.
nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu.
Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba uba n'ebere, Ọ nāb͕aghara kwa ajọ omume na njehie, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere kwa ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.
Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi;
Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.
gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;
Kraist mere ka ayi pua n'orù ka ayi we nwere onwe-ayi: ya mere nēguzosinu ike, unu ekwela ka ewere yoke nke bu ibu-orù jide unu ọzọ.
gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;
Ya mere ọ buru na onye ọ bula di nime Kraist, ọ bu onye ekère ọhu: ihe ochie agasiwo; le, ha aghọwo ihe ọhu.
Umu-ntakirim, unu onwe-unu bu ndi siri na Chineke puta, unu emeriwo kwa ha: n'ihi na Onye ahu Nke nọ nime unu ka onye ahu nke nọ n'uwa uku.
[5] Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa. [6] Ọ tua Devid nkume, tu kwa ndi-orù nile nke eze, bú Devid: ndi Israel nile na ndi-dike nile di kwa n'aka-nri-ya na n'aka-ekpe-ya. [7] Ma otú a ka Shimai siri mb͕e ọ nākọcha, Pua, pua, gi nwoke ọbara na nwoke jọb͕uru onwe-ya: [8] Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu.
ozu-ya agaghi-adigide n'elu osisi abali nile, kama i ghaghi ilì ya n'ubọchi ahu; n'ihi na ihe-nkọcha nke Chineke ka onye a kwugburu akwugbu bu; ka i ghara imeru ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ọ buru ihe-nketa.
[5] gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì; [6] ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.
Onye Filistia ahu we si Devid, Ọ̀ bu nkita ka m'bu, na gi onwe-gi nēwere nkpa-n'aka biakutem? Onye Filistia ahu we were chi-ya nile kọcha Devid.
Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.
[29] N'ubọchi ahu ha agaghi-asi kwa ọzọ, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì. [30] Kama onye ọ bula gānwu n'ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì.
ma anamemere nnù umu-umu abua na ọgu iri ebere, bú nke ndi nāhum n'anya, nēdebe kwa ihe nile M'nyere n'iwu.
[10] Agaghi-ahuta n'etiti gi onye nēme ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku, ma-ọbu onye nāju ase, ma-ọbu onye nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ma-ọbu onye nāb͕a afa, ma-ọbu onye-mb͕asi, [11] ma-ọbu dibia nrafu, ma-ọbu onye nāju mọ ihe, ma-ọbu dibia-afa, ma-ọbu onye nāju ndi nwuru anwu ihe. [12] N'ihi na ihe-árú nke Jehova ka onye ọ bula nke nēme ihe ndia bu: ọ bu kwa n'ihi ihe-árú ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nānapu ha ala-ha n'iru gi.
[37] É-è, kama n'ihe ndia nile ayi nēmeribiga ókè site n'aka Onye ahu Nke huru ayi n'anya. [38] N'ihi na emewo ka m'kweye, na ọnwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, [39] ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agaghi-apu ikewapu ayi n'ihu-n'anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.
[8] Nwenu anya-udo, nēchenu nche: onye ahu nke nēkuru unu ga ikpé, bú ekwensu, dika ọdum nāb͕ọ uja, ọ nējeghari, nāchọ onye o gēlomi: [9] ma nēguzogidenu ya, n'ihi na unu di ike n'okwukwe-unu, ebe unu matara na anēmezu otù ahuhu ahu n'aru ndi bu òtù umu-nna-unu ndi nọ n'uwa.
[17] Adam ka Ọ sikwara, N'ihi na i gewo nti n'olu nwunye-gi, i we rie nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, si, Gi erila nkpuru sitere na ya: ihe anābu ọnu ka ala bu n'ihi gi; n'ihe-nb͕u ka i gēri ihe sitere na ya ubọchi nile nke ndu-gi; [18] o bu kwa ogwu na uke ka ọ gēpuru gi; i gēri kwa ihe-ọkukú nke ubi; [19] n'ọsusọ iru-gi ka i gēri nri, rue mb͕e i gālata n'ala; n'ihi na esiri na ya weputa gi; n'ihi na ájá ka i bu, ọ bu kwa ájá ka i gālata.
[10] Ọ si, Gini ka i meworo? ge nti! olu ọbara nwa-nne-gi nētikum site n'ala. [11] Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi; [12] mb͕e i nālu ọlu ubi, ọ gaghi-enye gi ike-ya ọzọ; onye nāṅaghari na ọsọ ka i gābu n'uwa.
[18] Umu-ndikom Noa, ndi siri n'ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean. [19] Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara. [20] Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine: [21] ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya. [22] Ham, bú nna Kenean, we hu ọtọ nna-ya, gosi umu-nne-ya ndikom abua n'èzí. [23] Shem na Jefet we chiri uwe-nb͕okwasi, tukwasi n'ubu ha abua, were azu-ha je, kpuchie ọtọ nna-ha; ma iru-ha di n'azu, ha ahughi kwa ọtọ nna-ha. [24] Noa we teta n'ura manya-vine-ya, mara ihe nwa-ya nwoke nke-ntà mere ya. [25] Ọ we si, Onye anābu ọnu ka Kenean bu; Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom. [26] Ọ si kwa, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Shem, bu; Ka Kenean ghọkwara ha orù. [27] Ka Chineke me ka Jefet setia, Ya biri kwa n'ulo-ikwū nile nke Shem; Ka Kenean ghọ-kwa-ra ha orù.
[32] Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda. [33] Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova. [34] Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara. [35] Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n'ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n'ọnọdu Abaiata. [36] Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n'ebe ahu, esi-kwa-la n'ebe ahu pua je ebe ọ bula. [37] O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi. [38] Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi. [39] O rue, n'ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat. [40] Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi. [41] Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa. [42] Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Èmeghm ka i were Jehova ṅua iyi, m'we b͕ara gi àmà, si, Mara nke-ọma, na i ghaghi inwu n'ubọchi i gāpu je n'ebe ọ bula? i we sim, Ọ di nma, bú okwu m'nuru. [43] Ọ̀ bu kwa gini mere i nēdebeghi iyi Jehova, na ihe enyere n'iwu nke m'nyere gi n'iwu? [44] Eze si-kwa-ra Shimai, Gi onwe-gi mara ihe ọjọ nile nke obi-gi mara, nke i mere Devid, bú nnam: Jehova gēme kwa ka ihe ọjọ gi laghachi n'isi-gi. [45] Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi. [46] Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon.
Nwunye-ya we si ya, Ì nọ nējide izu-okè-gi? b͕akuta Chineke azu, nwua.
Iku-umem aghọwo iku-ume onye nābughi di-ya n'ebe nwunyem nọ, Ariọwokwam umu afọ nnem aririọ-amara.
Ọ̀ bughi Gi onwe-gi b͕aworo ya, b͕a-kwa-ra ulo-ya, b͕a-kwa-ra ihe nile o nwere, ogige buruburu? I gọziwo ọlu aka-ya abua, ihe-nnweta-ya ab͕asawo kwa n'ala.
[10] Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya. [11] Yikwasinu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ihe nile ekwensu nēzuputa. [12] N'ihi na ib͕a-nb͕a-ayi abughi imegide anu-aru na ọbara, kama ọ bu imegide ibu-ndi-isi nile, imegide ichi-isi nile, imegide ndi-onwe-uwa nke ọchichiri a, imegide ndi-agha mọ nke ajọ ihe n'ebe di n'elu-igwe. [13] N'ihi nka chilienu ihe-agha nile nke Chineke, ka unu we pu iguzogide ndi-iro-unu n'ajọ ubọchi, na iguzo, ebe unu luputaworo ihe nile. [14] Ya mere guzonu, mb͕e unu weresiri ezi-okwu ke úkwù-unu, were kwa ihe-agha nke nēb͕ochi obi yikwasi, bú ezi omume, [15] were kwa nkwadebe nke bu ozi ọma nke udo yikwasi n'ukwu-unu; [16] tukwasi ihe nile ndia welienu ọta nke bu okwukwe, nke unu gāpu imenyu àkú-uta nile nēnwu ọku nke ajọ onye ahu nime ya. [17] Nara-kwa-nu okpu-agha nke bu nzọputa, ya na mma-agha nke Mọ Nsọ, nke bu okwu Chineke:
ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;
N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.
Ọ we si, Onye anābu ọnu ka Kenean bu; Orù nke ndi-orù ka ọ gāburu umu-nne-ya ndikom.
I kpawo ókè ka ha we ghara igabiga ya; Ka ha we ghara ilaghachi ikpuchi uwa.
Chineke we hu uwa, ma, le, ebibiri ya; n'ihi na anu-aru nile, bú madu, bibiri uzọ-ya n'elu uwa.
Cubit iri na ise ka miri ahu di ike site n'elu ugwu; ewe kpuchie ugwu nile.
[5] Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu. [6] O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere: [7] o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa. [8] Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba; [9] ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ.
M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe unu nọ: agaghi-ebipu kwa anu-aru nile ọzọ site na miri nke iju-miri ahu; iju-miri agaghi-adi kwa ọzọ ibibi uwa.
Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu.
Igbo Bible 2006
Igbo Bible Society of Nigeria 1906, 2006