Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ezigbo agwa: [Ile ọbịa] HIBRU 3:2na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum.AISAIA 58:7Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?1 TIMỌTI 5:10onye anāb͕ara ya ezi àmà n'ọlu ọma; ọ buru na ọ zùputawo umu, ọ buru na o lewo ndi-ọbìa anya nke-ọma, ọ buru na ọ sawo ukwu ndi nsọ, ọ buru na o b͕owo nkpà ndi anākpab͕u, ọ buru na o sosiwo ezi ọlu nile ọ bula ike.TAITỌS 1:8kama ọ ghaghi ibu onye nēle ndi-ọbìa nke-ọma, onye nāhu ezi ihe n'anya, onye uche-ya zuru okè, onye ezi omume, onye di ọcha n'obi, onye nējidesi onwe-ya ike;1 PITA 4:8-9[8] nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n'anya ahu unu nāhurita onwe-unu di ike; n'ihi na ihu-n'anya nēkpuchi ọtutu nmehie: [9] nelērita onwe-unu ọbìa nke-ọma nātamughi ntamu: ỌLU OZI 16:33-34[33] O we kuru ha n'otù oge hour nke abali ahu, sa ọnyá ihe-otiti-ha; ngwa ngwa ewe me ya baptism, ya onwe-ya na ndi-ya nile. [34] O we kugo ha n'ulo-ya, dọba ihe-oriri n'iru ha, obi nātọ kwa ya utọ nke-uku, ya na èzí-na-ulo-ya nile, ebe o kwere Chineke. LEVITIKỌS 19:33-34[33] Mb͕e ọbìa gānoyere gi dika ọbìa n'ala-unu, unu emela ya ihe-ike. [34] Dika onye amuru n'ala site n'aru unu ka ọbìa gādiri unu, bú onye nọ dika ọbìa n'etiti unu, i gāhu kwa ya n'anya dika onwe-gi; n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu. LUK 14:7-14[7] O we turu ndi akpọrọ ilu, mb͕e Ọ ribara ama otú ha nārọrọ isi ọnọdu; nāsi ha, [8] Mb͕e ọ bula madu gākpọ gi n'oriri ọlulu-nwunye, anọdula n'isi ọnọdu; ma eleghi anya ọ kpọwori otù onye ka gi na nsọpuru, [9] onye kpọrọ gi na ya we bia si gi, Nye nwoke a ọnọdu; mb͕e ahu i gāmalite iji ihere were ọnọdu ikpe-azu. [10] Ma mb͕e ọ bula agākpọ gi, ga nọdu n'ọnọdu ikpe-azu; ka, mb͕e onye kpọworo gi gābia, ka o we si gi, Eyìm, rigo n'ọnọdu ka elu: mb͕e ahu i gēnwe otuto n'iru ndi nile gi na ha nānọdu na nri. [11] N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu. [12] O we si kwa onye kpọrọ Ya-ri, Mb͕e ọ bula i siri nri-ututu ma-ọbu nri-anyasi, akpọla ndi-eyì-gi, ma-ọbu umu-nne-gi, ma-ọbu ndi-ikwu-gi, ma-ọbu ndi-ab͕ata-obi-gi, bú ndi ọgaranya; ka ha onwe-ha we ghara ikpọghachi kwa gi ma eleghi anya, ewe nyeghachi gi ihe. [13] Kama mb͕e ọ bula i siri nri uku, kpọ ndi-ob͕eye, ndi-ọlusi, ndi-ngwurọ, ndi-ìsì: [14] onye-ngọzi ka i gābu; n'ihi na ha enweghi ihe inyeghachi gi: n'ihi na agēnyeghachi gi na nbilite-n'ọnwu nke ndi ezi omume. MATIU 25:34-46[34] Mb͕e ahu Eze ahu gāsi ndi nọ n'aka-nri-Ya, Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa: [35] n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam; [36] ab͕aram ọtọ, unu we b͕okwasim ákwà: aru adighm ike, unu we letam: anọm n'ulo-nkpọrọ, unu we biakutem. [37] Mb͕e ahu ndi ezi omume ahu gāza Ya, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi we zùa Gi? ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi? [38] Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka I bu ọbìa, ayi we kpọbata Gi? ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ayi we b͕okwasi Gi ákwà? [39] Òle mb͕e ayi hu-kwa-ra Gi ka aru nādighi ike, ma-ọbu n'ulo-nkpọrọ, ayi we biakute Gi? [40] Eze ahu gāza kwa, si ha, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye. [41] Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya: [42] n'ihi na agu gurum, ma unu enyeghm ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, ma unu ekughi miri nyem: [43] abum ọbìa, ma unu akpọbataghm; ab͕aram ọtọ, ma unu eb͕okwasighm ákwà; aru adighm ike, anọkwam n'ulo-nkpọrọ, ma unu eletaghm. [44] Mb͕e ahu ndi ahu gāza kwa, si, Onye-nwe-ayi, òle mb͕e ayi huru Gi ka agu nāgu Gi, ma-ọbu ka akpiri nākpọ Gi nku, ma-ọbu ka I bu ọbìa, ma-ọbu ka I nāb͕a ọtọ, ma-ọbu ka aru nādighi Gi ike, ma-ọbu ka I nọ n'ulo-nkpọrọ, ma ayi ejereghi Gi ozi? [45] Mb͕e ahu Ọ gāza ha, si, N'ezie asim unu, Ka ọ ra, bú otú unu nēmeghi ya nye otù onye nime ndia dikarisiri ntà, Mu ka unu nēmeghi ya nye. [46] Ndia gāpu je ba n'ahuhu-nmehie ebighi-ebi: ma ndi ezi omume gābà na ndu ebighi-ebi. ROM 12:13-20[13] n'akuku ihe nākpà ndi nsọ, nēnwekọnu ihe; nāb͕asonu ọlu ile ndi-ọbìa anya nke-ọma. [14] Nāgọzinu ndi nēsob͕u unu; nāgọzinu, abu-kwa-la ha ọnu. [15] Nēsonu ndi nāṅuri n'iṅuri ọṅu; nēsonu ndi nākwa ákwá n'ikwa ákwá. [16] Nātukwasinu uche n'otù ihe ahu n'ebe ibe-unu nọ. Unu atukwasila uche n'ihe di elu, kama ka ndi ọnọdu-ha di ala nādọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n'anya onwe-unu. [17] Unu enyeghachila onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ. Burunu uzọ nēchè ihe ọma n'iru madu nile. [18] Asi na ọ bu ihe gēkwe unu, ka ihe nke diri unu onwe-unu ra, unu na madu nile nādi n'udo. [19] Ndi m'huru n'anya, unu abọlara onwe-unu ọ́bọ̀, kama charanu iwe ahu uzọ: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Mu nwe ọ́bọ̀; Mu onwem gēnyeghachi, ka Onye-nwe-ayi kwuru. [20] Ma ọ buru na agu nāgu onye-iro-gi, nāzù ya; ọ buru na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ṅua miri: n'ihi na n'ime nka i gāgukwasi icheku nēre ọku n'isi-ya. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006