Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Ndụ: [Mụ anụmanụ]
Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.
o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a.
N'ihi na aha nile ọ bula nke anu na anu-ufe, nke ihe nākpu akpu na ihe di n'oké osimiri, ha nile ka ihe akpọrọ madu nēmeju anya, o mejuwo kwa ha anya:
Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.
Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?
Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.
Tugharinu uche n'ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?
Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?
Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.
Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u, N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.
[19] Jehova, bú Chineke, we site n'ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya. [20] Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya.
[2] Egwù-unu na ujọ-unu gādikwasi n'anu nile ọ bula nke uwa nke di ndu, na n'anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; tiyere ihe nile ọ bula nke ala nēnuputa, tiye-kwa-ra azù nile nke oké osimiri, n'aka-unu ka enyeworo ha. [3] Ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, nke di ndu, gāburu unu ihe-oriri; dika akwukwọ ihe-ọkukú ka M'nyeworo unu ha nile.
[24] Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a. [25] Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma. [26] Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa. [27] Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha. [28] Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa.
[6] Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe: [7] Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi, [8] Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi.
[6] I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua: [7] Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia; [8] Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri, Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile. [9] Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!
[7] Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi: [8] Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi. [9] Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka? [10] Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.
[6] Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n'otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha. [7] Nne-ehi na anu-ọhia bear gātakọ kwa nri; umu-ha gāmakpukọ: ọdum gāta kwa okporo-ọka dika ehi. [8] Nwa nāṅu ara gēgwuri kwa egwú n'elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubí ka nwa emere ka ọ rapu ara gātukwasi aka-ya. [9] Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri.
[18] Mu onwem siri n'obim, Ọ bu n'ihi umu madu, ka Chineke we meme ka ha puta ìhè, ka ha we hu kwa, na ha onwe-ha bu anumanu, ha n'onwe-ha. [19] N'ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n'ihi na ha nile bu ihe-efu. [20] Ha nile nāla n'otù ebe; ha nile siri n'ájá puta, ha nile nālaghachi kwa n'ájá. [21] Ònye mara mọ nke umu madu, ma nke ahu nārigo arigo, na mọ nke anumanu, ma nke ahu nārida n'okpuru rue ala?
[7] Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile: [8] Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya: [9] Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile: [10] Anu-ọhia na anu-ulo nile; Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù: [11] Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche; Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa: [12] Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ; Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri:
Igbo Bible 2006
Igbo Bible Society of Nigeria 1906, 2006