Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ndụ: [Mụ anụmanụ] JENESIS 1:21Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.JENESIS 1:30o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a.JEMES 3:7N'ihi na aha nile ọ bula nke anu na anu-ufe, nke ihe nākpu akpu na ihe di n'oké osimiri, ha nile ka ihe akpọrọ madu nēmeju anya, o mejuwo kwa ha anya:JEREMAIA 8:7Ọbuná ub͕ala n'elu-igwe mara mb͕e-ya nile akara àkà; ọzọ, nduru na eleke na okwoli nāriba mb͕e ọbibia-ha ama; ma ndim amaghi ikpé Jehova.JOB 35:11Onye nēzí ayi ihe kari anu nke uwa, Ọ nēme kwa ka ayi mara ihe kari anu-ufe nke elu-igwe?LUK 3:6Madu nile gāhu kwa nzọputa Chineke.LUK 12:24Tugharinu uche n'ugolo-ọma, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewe kwa ihe ubi; nke nēnweghi ime-ulo ntà ma-ọbu ọba; ma Chineke nāzù ha: ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari anu-ufe nke-uku?MATIU 6:26Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?ILU 12:10Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.ABÙ ỌMA 104:21Umu-ọdum nāb͕ọ uja na-achọ anu ha gādọb͕u, N'ichọ kwa ihe-oriri-ha n'aka Chineke.JENESIS 2:19-20[19] Jehova, bú Chineke, we site n'ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya. [20] Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya. JENESIS 9:2-3[2] Egwù-unu na ujọ-unu gādikwasi n'anu nile ọ bula nke uwa nke di ndu, na n'anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; tiyere ihe nile ọ bula nke ala nēnuputa, tiye-kwa-ra azù nile nke oké osimiri, n'aka-unu ka enyeworo ha. [3] Ihe nile ọ bula nke nākpu akpu, nke di ndu, gāburu unu ihe-oriri; dika akwukwọ ihe-ọkukú ka M'nyeworo unu ha nile. JENESIS 1:24-28[24] Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a. [25] Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma. [26] Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa. [27] Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha. [28] Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa. ILU 6:6-8[6] Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe: [7] Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi, [8] Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi. ABÙ ỌMA 8:6-9[6] I nēme ya ka ọ nāchi ọlu nile nke aka-Gi abua; Ihe nile ka I doro n'okpuru ukwu-ya abua: [7] Ewu na aturu na ehi, ha nile, Ha na anu ọhia; [8] Nnunu elu-igwe, na azù nile nke oké osimiri, Bú ihe nke nāgabiga n'uzọ nile nke oké osimiri nile. [9] Jehova, Onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile! JOB 12:7-10[7] Ma otú ọ di, biko, jua anumanu, ha gēzí kwa gi ihe, Na anu-ufe nke elu-igwe, ha gēgosi kwa gi: [8] Ma-ọbu gi na uwa kparita uka, o gēzí kwa gi ihe; Azù nke oké osimiri gākọ-kwa-ra gi. [9] Ọ̀ bu onye nāmaghi n'ihe ndia nile, Na aka Jehova emewo nka? [10] Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu. AISAIA 11:6-9[6] Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n'otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha. [7] Nne-ehi na anu-ọhia bear gātakọ kwa nri; umu-ha gāmakpukọ: ọdum gāta kwa okporo-ọka dika ehi. [8] Nwa nāṅu ara gēgwuri kwa egwú n'elu ọnu aju-ala nọ, ọ bu kwa anya ubí ka nwa emere ka ọ rapu ara gātukwasi aka-ya. [9] Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri. EKLISIASTIS 3:18-21[18] Mu onwem siri n'obim, Ọ bu n'ihi umu madu, ka Chineke we meme ka ha puta ìhè, ka ha we hu kwa, na ha onwe-ha bu anumanu, ha n'onwe-ha. [19] N'ihi na ihe nādabàra umu madu, ihe nādabà-kwa-ra anumanu; ọbuná otù ihe ahu nādabàra ha: dika ọnwu nke anumanu si di, otú a ka ọnwu nke madu di; e, otù mọ ka ha nile nwere; ọ dighi kwa ọkaka madu nwere kari anumanu: n'ihi na ha nile bu ihe-efu. [20] Ha nile nāla n'otù ebe; ha nile siri n'ájá puta, ha nile nālaghachi kwa n'ájá. [21] Ònye mara mọ nke umu madu, ma nke ahu nārigo arigo, na mọ nke anumanu, ma nke ahu nārida n'okpuru rue ala? ABÙ ỌMA 148:7-12[7] Tonu Jehova site n'uwa, Unu ogologo anu-miri, na ob͕u-miri nile: [8] Ọku, na ákú-miri-ígwé, na snow, na alulu: Oké ifufe, nke nēme okwu-Ya: [9] Ugwu nile na ugwu ntà nile; Osisi nile nāmi nkpuru na osisi cedar nile: [10] Anu-ọhia na anu-ulo nile; Ihe nākpu akpu na nnunu nwere nkù: [11] Ndi-eze uwa na ndi nile di iche iche; Ndi-isi na ndi-ikpé nile nke uwa: [12] Ma umu-okorọbia ma umu-ab͕ọghọ; Ndi-agadi, ha na umu-ntakiri: Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006