Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ndụ: [Mmekọahụ] 2 KỌRINT 12:21ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.EFESỌS 5:3Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ;EFESỌS 5:33Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.GALETIA 5:19Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,JENESIS 2:24N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.HIBRU 13:4Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.1 KỌRINT 6:9Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,1 KỌRINT 6:18B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya.1 JỌN 1:9Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa Onye ezi omume, ka O we b͕aghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile.MATIU 5:28ma Mu onwem si unu, na nwoke ọ bula nke nēle nwanyi anya ka agu ya we gua ya, ọ kwasiwo ya iko n'obi-ya ub͕u a.MAK 7:22-23[22] ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche: [23] ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu. 1 TESALỌNAIKA 4:3-5[3] N'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ, ka unu ghara ikwa iko; [4] ka onye ọ bula nime unu matara otú ọ gēnwe nwunye nke aka ya n'odido-nsọ na nsọpuru, [5] ọ bughi n'ọchichọ ọjọ nke agu ihe ọjọ, ọbuná dika ndi mba ọzọ ndi nāmataghi Chineke; MAK 10:6-9[6] Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha. [7] N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; [8] ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru. [9] Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala. ILU 5:15-19[15] Ṅua miri sitere n'olùlù nke aka gi, Na miri nērù erù site n'ime olùlù-miri nke aka gi. [16] Isi-iyi-gi, hà gāwasasi n'èzí? Ọ̀ bu n'amá ka iyi miri gāwasasi? [17] Ka ha diri nání gi onwe-gi, Ma ka ndi nābughi ndi nke gi ghara isoro gi nwe ha. [18] Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia. [19] Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile. 1 KỌRINT 13:4-8[4] Ihu-n'anya nwere ogologo-ntachi-obi, o nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n'anya adighi-ekwo ekworo; ihu-n'anya adighi-anya isi, ọ dighi-afuli onwe-ya elu, [5] ọ dighi-eme ihe nādighi nma n'anya, ọ dighi-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adighi-ewe ya, ọ dighi-agu ihe ọjọ emere ya; [6] ọ dighi-aṅuri ọṅu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ṅurikọ ọṅu; [7] ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n'ihe nile. [8] Ihu-n'anya adighi-ada mb͕e ọ bula: ma ọ buru na ibu-amuma di, agēme ka ha ghara idi irè; ọ buru kwa na asusu di iche iche di, ha gāgwu; ọ buru kwa na ihe-ọmuma di, agēme ka ọ ghara idi irè. ABÙ NKE ABÙ 7:6-12[6] Le ka i si ma nma nke-uku, le kwa ka i si di utọ nke-uku, Gi ihu-n'anya, n'ihe-utọ nile! [7] Ogologo-gi nka yiri nkwu, Ara-gi abua yiri uyọkọ nkpuru-vine. [8] M'siri, M'gārigo elu nkwu, M'gējide igu-ya aka: Biko, ka ara-gi abua di kwa ka uyọkọ osisi vine, Ka ísì utọ nke imi-gi di kwa ka nkpuru-osisi apple; [9] Ka okpo-ọnu-gi di kwa ka manya-vine makarisiri nma, Nke nāsughari n'iko nke-ọma nye onye ihe-ya nātọm utọ, Nke nērùbà nwayọ n'eb͕ub͕ere-ọnu abua nke ndi nāraru ura. [10] Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, N'arum ka ọchichọ-ya di kwa. [11] Bia, gi onye ihe-gi nātọm utọ, ka ayi pua ba n'ọhia; Ka ayi nọ ọnọdu-abali n'obodo ntà. [12] Ka ayi bilie n'isi-ututu je rue ubi-vine nile; Ka ayi hu ma osisi vine amawo ifuru, Ma okoko-ya ab͕awawo, Ma osisi pomegranate ab͕awawo okoko: N'ebe ahu ka m'gēnye gi ihu-n'anyam. 1 KỌRINT 6:13-20[13] Ihe-oriri nile diri afọ, afọ di-kwa-ra ihe-oriri nile: ma Chineke gēme ka ya na ha ghara idi irè. Ma aru-ayi adirighi ikwa-iko, kama ọ diri Onye-nwe-ayi; Onye-nwe-ayi di-kwa-ra aru-ayi: [14] ma Chineke mere ka Onye-nwe-ayi si n'ọnwu bilie, Ọ gēsite kwa n'ike-Ya me ka ayi onwe-ayi si n'ọnwu bilie. [15] Ùnu amataghi na aru-unu bu ihe di n'aru Kraist? #m'gēwepu kwa ihe di n'aru Kraist, me ha ka ha buru ihe di n'aru nwanyi nākwa iko? Chineke ekwela. [16] Ma-ọbu ùnu amataghi na onye nārapara n'aru nwanyi nke nākwa iko, ya na ya bu otù aru? n'ihi na, Ha abua ka O kwuru, gāghọ otù anu-aru. [17] Ma onye nārapara n'aru Onye-nwe-ayi, ya na Ya bu otù mọ. [18] B͕anarinu ikwa-iko. Nmehie nile ọ bula nke madu nēme di n'elu aru; ma onye nākwa iko nēmehie megide aru nke onwe-ya. [19] Ma-ọbu ùnu amataghi na aru-unu bu ulo nsọ nke Mọ Nsọ, Onye bi nime unu, Onye unu nwere site na Chineke? ọ bughi kwa unu onwe-unu nwe onwe-unu; [20] n'ihi na ewere ọnu-ahia b͕ara unu: ya mere nyenu Chineke otuto n'aru-unu. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006