Isiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ndụ: [Amaokwu maka Womenmụ nwanyị] ABÙ ỌMA 46:5Chineke nọ n'etiti ya; agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya: Chineke gēyere ya aka mb͕e chi bọrọ.ABÙ ỌMA 139:14M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma.1 TIMỌTI 3:11Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile.1 KỌRINT 11:12N'ihi na dika nwanyi siri na nwoke puta, otú a ka nwoke site-kwa-ra n'aka nwanyi; ma ihe nile si na Chineke puta.1 KỌRINT 15:10Ma site n'amara Chineke abum ihe m'bu: ahu-kwa-ra na amara-Ya nke enyerem abughi ihe-efu; kama adọb͕ubigaram onwem ókè n'ọlu kari ha nile: ma ọ bughi mu onwem, kama amara Chineke nke sorom.LUK 1:45Ngọzi nādi-kwa-ra nwanyi ahu nke kwere na ihe ndia gēmezu, bú nke agwaworo ya site n'ọnu Onye-nwe-ayi.ILU 11:16Nwayi amara nējidesi nsọpuru ike: Ndi nēme ka madu ma jijiji nējidesi kwa àkù ike.ILU 14:1Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya.ILU 19:13Ila-n'iyi nile n'ebe nna-ya nọ ka nwa nzuzu bu: Ọzọ, miri-ọtutu nātu mb͕e nile ka ise-okwu nwunye bu.ILU 21:9Ọ di nma inọkwasi na nkuku elu ulo, Kari inọyere nwayi nēse okwu n'ulo bùru ibù.ILU 21:19Ọ di nma inọ n'ala bú nání ọzara, Kari inọyere nwayi nēse okwu nākpasu kwa iwe.1 PITA 3:1-2[1] Otú ahu, ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu; ka, ọbuná asi na ufọdu ekweyeghi okwu Chineke, ka ewe site n'ibi-obi nwunye-ha rita ha n'urù n'ebe anēkwughi okwu; [2] mb͕e ha nēle ibi-obi-unu di ọcha, ya na egwu. EFESỌS 5:22-23[22] Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi. [23] N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru. ILU 31:16-17[16] O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine. [17] O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume. TAITỌS 2:3-5[3] otú ahu ka agadi-ndinyom di nsọ n'omume-ha, ghara ibu ndi nēbo ebubo ugha, ghara kwa ibu orù nke iṅubiga manya ókè, ka ha buru ndi nēzí ihe ọma; [4] ka ha we me ka ndi bu umu-ab͕ọghọ nwe uche zuru okè ibu ndi nāhu di-ha n'anya, ndi nāhu umu-ha n'anya, [5] ndi uche-ha zuru okè, ndi di ọcha, ndi nālu ọlu n'ulo, ezi madu, ndi nēdo onwe-ha n'okpuru di nke aka ha, ka ewe ghara ikwulu okwu Chineke: JENESIS 2:18-24[18] Jehova, bú Chineke, we si, Ọ dighi nma ka madu ahu nọ nání ya; M'gēmere ya onye-iye-aka kwesiri ya. [19] Jehova, bú Chineke, we site n'ala kpu anu-ọhia nile ọ bula, na anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe; O we me ka ha biakute madu ahu, ihu ihe ọ gākpọ ha: ma aha ọ bula madu ahu nākpọ anu nwere nkpuru-obi di ndu, nke ahu bu aha-ya. [20] Madu ahu we kpọ anu-ulo nile na anu-ufe nke elu-igwe na anu-ọhia nile ọ bula aha; ma madu, ahughi onye-iye-aka kwesiri ya. [21] Jehova, bú Chineke, we me ka oké ura dakwasi madu ahu, o we raru ura; O we weputa otù nime ọgiriga-ya, mechie anu-aru n'ọnọdu-ya: [22] ọgiriga ahu, bú nke O weputara n'aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu. [23] Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n'ọkpukpum puta, na anu-aru si n'anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n'ihi na eweputara nka n'aru Nwoke. [24] N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru. 1 TIMỌTI 2:9-15[9] Otú ahu, ezuberem ka ndinyom were ihe-ichọ-nma kwesiri ekwesi chọ onwe-ha nma, ya na nsọpuru na uche zuru okè; ọ bughi isi akpara akpa, na ọla-edo ma-ọbu pearl ma-ọbu uwe di oké ọnu-ahia; [10] kama (nke kwesiri ndinyom nēkwuputa egwu Chineke) ka ha site n'ezi ọlu chọ onwe-ha nma. [11] Ka nwanyi were nwayọ muta n'ido onwe-ya n'okpuru n'uzọ nile. [12] Ma ekweghm nwanyi ka o zí ihe, ma-ọbu ka ọ buru onye-isi n'ebe nwoke nọ, kama ka ọ nọ n'ọnọdu nwayọ. [13] N'ihi na Adam ka eburu uzọ kpu, mb͕e ahu ewe kpu Iv; [14] ọ bughi kwa Adam ka aghọrọ aghughọ, ma ebe aghọb͕uru nwanyi ọ bu nwanyi ahu ka ahuworo na ọ nọ nime njehie: [15] ma agēsite n'ọmumu-nwa-ya zọputa ya, ma ọ buru na ha anọgide nime okwukwe na ihu-n'anya na odido-nsọ, ya na uche zuru okè. ILU 31:1-31[1] Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti. [2] Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere? [3] Enyela ndinyom ike-gi, Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile. [4] Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di? [5] Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala. [6] Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine: [7] Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu, Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ. [8] Saghere onye-ob͕i ọnu-gi, N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì. [9] Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume, Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye. [10] Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya? N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku. [11] Obi di-ya atukwasiwo ya obi, Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu. [12] Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya. [13] Ọ chọwo aji-anu na flax, We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ. [14] Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia; Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya. [15] O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa, We nye ulo-ya nri, Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha. [16] O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine. [17] O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume. [18] Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma: Oriọna-ya adighi-anyu n'abali. [19] Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho, Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike. [20] Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru. [21] Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie. [22] Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu. [23] Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala. [24] Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia. [25] Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya; Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì. [26] Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya. [27] Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri. [28] Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si: [29] Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile. [30] Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto [31] Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006