[16] N'ihi nka ike agwughi ayi n'obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu-aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ubọchi. [17] N'ihi na nkpab͕u-ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ́ di kwa ebighi-ebi; [18] ebe ayi nādighi-ele ihe anāhu anya, kama ihe anādighi-ahu anya: n'ihi na ihe anāhu anya nādiru nwa oge; ma ihe anādighi-ahu anya di ebighi-ebi. [19] N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.
O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha.
ma ndi nēle anya Jehova gāb͕anwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāb͕a ọsọ, ike agaghi-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida #mbà.
Dinu ike, nwe-kwa-nu ume, unu atula egwu, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha; n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye gi na Ya nēje; Ọ gaghi-ara gi aka, Ọ gaghi-arapu kwa gi.
[28] Biakutenum, unu nile ndi nādọb͕u onwe-unu n'ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ́, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike. [29] Nyaranu yoke nkem n'olu-unu, muta-kwa-nu ihe n'ọnum; n'ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n'obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu.
Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nētiku: O nēsi n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua.
Ihe ọ bula nwere oge, mb͕e di-kwa-ra ihe ọ bula anēme n'okpuru elu-igwe:
N'ihi na Mu onwem mara èchìchè nile nke Mu onwem nēchè bayere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), èchìchè nke udo, ọ bughi nke ihe ọjọ, inye unu ọdi-n'iru na ntukwasi-obi.
[1] Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu. [2] N'ulo Nnam ọtutu ebe-obibi di; ọ buru na ọ bughi otú a, M'gāgwawori unu; n'ihi na anamaga idoziri unu ebe. [3] Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M'gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ. [4] Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya.
[16] Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāb͕a àmà, na ayi bu umu Chineke: [17] ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto. [18] N'ihi na anamagu na ahuhu nile nke oge di ub͕u a ekwesighi ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n'ebe ayi nọ. [19] N'ihi na olile-anya siri ike nke ihe nile ekère èkè nēchesi nkpughe nke umu-ndikom Chineke ike. [20] N'ihi na edoro ihe ahu ekèrè èkè n'okpuru ihe-efu, ọ bughi na ọ chọrọ ya, kama n'ihi Onye ahu Nke doro ya n'okpuru ya n'olile-anya; [21] n'ihi na agēme ka ihe ekère èkè onwe-ya pu kwa n'ibu-orù nmebi ba n'ọnọdu inwe-onwe-ya nke ebube nke umu Chineke. [22] N'ihi na ayi matara na ihe ekère èkè nile nāsukọ udè, ime nēmekọ kwa ha, rue ub͕u a. [23] Ma ọ bughi nání nka, kama ayi onwe-ayi, ndi nwere nkpuru mbu nke Mọ Nsọ, ọbuná ayi onwe-ayi nāsu kwa udè nime onwe-ayi, mb͕e ayi nēchesi ido-ka-nwa-nwoke ahu ike, bú nb͕aputa nke aru-ayi. [24] N'ihi na ọ bu n'olile-anya ka azọputara ayi: ma olile-anya nke anāhu anya abughi olile-anya: n'ihi na ihe madu nāhu anya, gini mere o ji nēle anya ya? [25] Ma ọ buru na ayi nēle anya ihe ayi nāhughi anya, ayi ji ntachi-obi nēchesi ya ike.
Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,
[3] Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke obi-ebere nile na Chineke nke nkasi-obi nile; [4] Onye nākasi ayi obi na nkpab͕u-ayi nile, ka ayi we pu isite na nkasi-obi nke Chineke ji kasi ayi onwe-ayi obi kasie ndi ahu obi ndi nọ na nkpab͕u ọ bula. [5] N'ihi na dika ahuhu nile Kraist huru nābabiga ókè n'ebe ayi nọ, otú a ka nkasi-obi-ayi nābabiga kwa ókè site n'aka Kraist. [6] Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa: