Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu aIsiokwu Chineke Ngọzi Bịa Dị Ka Are Bụ Iwu Nkọcha Ngọzi Ego Nnwere onwe ime nhọrọ Amara Chineke Lovehụnanya Chineke Uche Chineke Oge Chineke Agaghị m ahapụ gị Ọrụ ebube Aha Chineke Onyinye Atụmatụ Na-azọpụta Atọ n'Ime Otu Oge Chụnanya na-enweghị atụ Nje Virus / Ọrịa Onye Chineke Bụ Ezigbo agwa Nnabata Mmechi Nyocha Nkwuwa okwu Ilekọta Dị ọcha Nkwa Nkwenye Afọ ojuju Obi ike / Obi Ike Ọmịiko Dọ aka ná ntị Okwukwe Na-ekele Chineke Ile ọbịa Ala / Obi Umeala Eziokwu Nsọpụrụ Ike n'ezi Obiọma Hụnanya Obi umeala Ebere Ndidi Odido nsacha Njikpa onwe Tụkwasị obi Omume Ọjọọ Iwe Nraranye Iji ike emegbu mmadụ Ilu Mkpesa Esemokwu Egwu Onye nzuzu Onye ihu abụọ Ekworo Ikpe Umengwụ Nganga Imegwara / Venbọ Ọbọ Ihe-efu Ime ihe ike Mmehie Ime na-ete ime Ụ ọgwụ ọjọọ Kwa iko Ndapụ n'ezi ofufe Nkọcha Alụkwaghịm Anyaụfụ Kwa iko Gluttony Asịrị Anyaukwu Atekpọasị Agụụ Gha Masturbation Iyigharị oge Izu ohi Ndụ Ka nká Mụ anụmanụ Nkuchi Ubochi omumu Mma Nọ Nanị Gị Mkpakọrịta nwoke na nwaanyị Ọnwụ Nsogbu Ndakpọ olileanya Nghọta Mmega Icskpụrụ omume Ibu Ọnụ Chọta Lovehụnanya Gbado anya Ezinụlọ Nri Ikpe ọmụma Ahụike Obi .tọ Hel Enweghi ike Ọnwụ Job Mfu Uche Uche Egwu Alụmdi na nwunye Ibute Chineke ụzọ Mgbu Rentzụ ụmụ Gbaa mgba Mmekọahụ Ọnwụnwa Ọnwụnwa Amaokwu Maka Menmụ nwoke Amaokwu maka Womenmụ nwanyị Agha Akụnụba Ndị inyom di ha nwụrụ Chọọchị Churchga Churchka Ọmụmụ Jizọs Mkpagbu Church Diakon Ndị nkuzi ugha Toga Eluigwe Mmụọ Nsọ Mezaịa Na Baịbụl Ndi ozuzu aturu Na-eto Chineke Ilu Jizọs Pentikọst Na-asụ Asụsụ Inye otu ụzọ n'ụzọ iri Ofufe Ọrụ Ndị Nwanyị Ihe omimi Ndị ọbịa Ọrịa cancer Akara Aka Dinosaurs Dragọn Nrọ Ewepụghị / Gburugburu .wa Refeyim na Bible Oge Ikpeazụ / Ọdịnihu Unicorns Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ Ndị isi ndị mmụọ ozi Ndị mmụọ ozi Beelzebul Ndị mmụọ ọjọọ Ndị mmụọ ozi na-eche nche Lucifa Dibịa afa / Ime Anwansi Ihe ngosi mgbakọ na mwepu Nọmba 3 Nọmba 5 Nọmba 7 Nọmba 8 Nọmba 10 Mgbakwunye Mmanya na-aba n'anya Abba ụba Ihe-árú Obi Emebiala Iri anụ mmadụ Ikpe ọnwụ Ọgwụ Ọjọọ Mmetụta Halloween Inyere Ndị Ogbenye Aka Ọpụpụ Ndị uwe ojii Pikpọpu akụkụ Gamlụ karịa otu nwanyị Revival Mwute Sayensị Nchebe Onwe Verygba Ohu Igbu onwe onye Talent Ogbugbu Ọrụ Ihe omimi: [Dinosaurs] AISAIA 27:1N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.JENESIS 1:21Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.ABÙ ỌMA 104:26N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga; Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.ROM 1:18N'ihi na esi n'elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n'ajọ omume;JENESIS 1:24-31[24] Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a. [25] Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma. [26] Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa. [27] Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha. [28] Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa. [29] Chineke we si, Le, enyewom unu ihe-ọkukú nile ọ bula nāmiputa nkpuru-ọghigha, nke di n'elu uwa nile, na osisi nile ọ bula, nke nkpuru osisi nāmiputa nkpuru-ọghigha di nime ya; unu ka ọ diri ibu ihe-oriri: [30] o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a. [31] Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi. JOB 40:15-24[15] Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi. [16] Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya. [17] Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya. [18] Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè. [19] Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso. [20] N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú. [21] N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti. [22] Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu. [23] Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya. [24] Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya? JOB 41:1-10[1] Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi? Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya? [2] Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya? [3] Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò? [4] Ò gēso gi b͕a ndu? Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi? [5] Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu? Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi? [6] Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia? Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia? [7] Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya? Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya? [8] Tukwasi ya ọbu-aka-gi; Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ. [9] Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya? [10] Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya: Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum? JOSHUA 10:1-10[1] O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n'udo, ha we nọ n'etiti ha; [2] o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike. [3] Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si, [4] Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n'ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n'udo. [5] Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha. [6] Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi. [7] Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà. [8] Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi. [9] Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo. [10] Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda. Igbo Bible 2006 Igbo Bible © Bible Society of Nigeria © 1906, 2006