N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.
Chineke we kè ogologo anu uku nile di na miri, na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nke nākpu akpu, nke miri nuputara, di iche iche, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche nke nwere nku: Chineke we hu na ọ di nma.
N'ebe ahu ka ub͕ọ nile nāga; Leviatham kwa, nke I kpuworo igwuri egwú nime ya.
N'ihi na esi n'elu-igwe kpughe iwe Chineke imegide asọpurughi-Chineke na ajọ omume nile nke madu, ndi nēb͕ochi ezi-okwu n'ajọ omume;
[24] Chineke we si, Ka ala weputa anu di iche iche nwere nkpuru-obi di ndu, anu-ulo, na ihe nākpu akpu, na anu-ọhia di iche iche nke uwa: o we di otú a. [25] Chineke we me anu-ọhia di iche iche nke uwa, na anu-ulo di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nke nākpu akpu n'ala: Chineke we hu na ọ di nma. [26] Chineke we si, Ka ayi kpua madu n'onyinyo-ayi, dika oyiyi-ayi si di: ka ha nwe kwa ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu-ulo, na n'aru uwa nile, na n'aru ihe nile ọ bula nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa. [27] Chineke we kè madu n'onyinyo-Ya, n'onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwayi ka O kere ha. [28] Chineke we gọzie ha: Chineke we si ha, Muanu ọmùmù, banu uba, juputa uwa, buda ya n'okpuru onwe-unu; nwekwanu ike n'aru azù nke oké osimiri, na n'aru anu-ufe nke elu-igwe, na n'aru anu nile ọ bula di ndu nke nākpu akpu n'elu uwa. [29] Chineke we si, Le, enyewom unu ihe-ọkukú nile ọ bula nāmiputa nkpuru-ọghigha, nke di n'elu uwa nile, na osisi nile ọ bula, nke nkpuru osisi nāmiputa nkpuru-ọghigha di nime ya; unu ka ọ diri ibu ihe-oriri: [30] o bu kwa anu-ọhia nile ọ bula nke uwa ka M'nyeworo akwukwọ ihe-ọkukú nile ọ bula, nye kwa anu-ufe nile ọ bula nke elu-igwe, nye kwa ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu uwa, nke nkpuru-obi di ndu di nime ya, ibu ihe-oriri: ọ we di otú a. [31] Chineke we hu ihe nile ọ bula O mere, ma, le, ọ di nma nke-uku. Anyasi we di, ututu we di, buru ubọchi nke-isi.
[15] Biko, le otobo, nke M'kèworo gi na ya; Ọ nāta ahihia dika ehi. [16] Biko, le, ike-ya di n'úkwù-ya, Ume-ya di kwa n'akwara nile nke afọ-ya. [17] Ọ nārọgọba ọdùdù-ya dika osisi cedar: Akpọwo akwara utaku-ukwu-ya. [18] Ọkpukpu-ya nile di ka ogidi ọla nwere umi; Ọgiriga-ya di ka nkpọro ígwè. [19] Ya onwe-ya bu nmalite uzọ nile nke Chineke: Onye meworo ya nēweta mma-agha-ya nso. [20] N'ezie ihe-ọmume ka ugwu nēbutere ya; Bú ebe anu-ọhia nile nēgwuli egwú. [21] N'okpuru osisi lotus ka ọ nēdina, N'ebe nzuzo nke amì, na apiti. [22] Osisi lotus nēji ǹdò-ha b͕ochie ya; Osisi willow nke miri-iyi di ya buruburu. [23] Le, osimiri nērùsi ike, ọ dighi-ama jijiji: Ọ nātukwasi obi, mb͕e Jọdan nāwaputa rue ọnu-ya. [24] Ànējide ya mb͕e ọ nēle anya? Ma-ọbu ànēwere ọnyà mapue imi-ya?
[1] Ì gēji nkò-azù dọrọ oké agu-iyi? Ma-ọbu ì gēji ndọ̀ biada ire-ya? [2] Ì gētiye udọ̀-ami n'imi-ya? Ma-ọbu i gēji ngu ígwè dupue àb͕à-ya? [3] Ọ̀ gāriọ gi ọtutu aririọ-amara? Ma-ọbu ọ̀ gāgwa gi okwu di nrò? [4] Ò gēso gi b͕a ndu? Ì gēwere ya ka ọ buru orù rue mb͕e ebighi-ebi? [5] Ì gēji ya gwu egwú dika nnunu? Ma-ọbu ì gēke ya ab͕u nye umu-ab͕ọghọ-gi? [6] Òtù ndi-azù, hà gēji ya zu ahia? Hà gēkè ya n'etiti ndi-ahia? [7] Ì gēji ígwè ebiri nkò maju akpukpọ-aru-ya? Ma-ọbu ì gēji ube-azù maju isi-ya? [8] Tukwasi ya ọbu-aka-gi; Cheta agha, eme-kwa-la ya ọzọ. [9] Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya? [10] Ọ dighi onye di irè nke ikpọte ya: Ònye kwa bu onye ahu nke gēguzo onwe-ya n'irum?
[1] O rue, mb͕e Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, nuru na Joshua ewerewo Ai, wezuga kwa ya ka ebibie ya; dika ọ mereri Jeriko na eze-ya, otú a ka o mere Ai na eze-ya; mb͕e ọ nu-kwa-ra na ndi bi na Gibeon emewo ka ha na Israel di n'udo, ha we nọ n'etiti ha; [2] o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike. [3] Adoni-zedek, bú eze Jerusalem, we zigara Hoham, bú eze Hebron, ziga-kwa-ra Piram, bú eze Jamut, ziga-kwa-ra Jafia, bú eze Lekish, ziga-kwa-ra Debia, bú eze Eglon, ozi, si, [4] Rigokutenum, yerem aka, ka ayi tib͕u kwa Gibeon: n'ihi na ọ mere ka ya onwe-ya na Joshua na umu Israel di n'udo. [5] Eze ise ndi-Amorait, bú eze Jerusalem, na eze Hebron, na eze Jamut, na eze Lekish, na eze Eglon, we chikọta onwe-ha, rigo, ha onwe-ha na ọmuma-ulo-ikwū-ha nile, we ma ulo-ikwū-ha imegide Gibeon, we buso ya agha. [6] Ndikom Gibeon we zigara Joshua ozi rue ọmuma-ulo-ikwū rue Gilgal, si, Arala ndi-orù-gi aka; rigokute ayi ngwa ngwa, zọputa ayi, ye-kwa-ra ayi aka: n'ihi na eze nile nke ndi-Amorait ndi bi n'ugwu achikọtawo onwe-ha imegide ayi. [7] Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà. [8] Jehova we si Joshua, Atula egwu ha: n'ihi na n'aka-gi ka M'nyeworo ha; ọ dighi nwoke nime ha nke gēguzo n'iru gi. [9] Joshua we biakwasi ha na mberede; n'ihi na ogologo abali nile ka o si na Gilagal rigo. [10] Jehova we chusa ha n'iru Israel, o tib͕ue ha oké ntib͕u na Gibeon, we chusa ha n'uzọ nrigo Bet-horon, tib͕ue ha rue Azeka, ru kwa Makeda.