Amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu a

Isiokwu
Chineke
Ezigbo agwa
Omume Ọjọọ
Mmehie
Ndụ
Chọọchị
Ihe omimi
Ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ
Ihe ngosi mgbakọ na mwepu
Mgbakwunye
Mmehie: [Ndapụ n'ezi ofufe]
unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì,
Ọ gēme kwa ka otù ọb͕ub͕a-ndu siere ọtutu madu ike otù ízù: ọ bu kwa na nkera ízù ahu ka ọ gēme ka àjà na onyinye-inata-iru-ọma kwusi; ọ bu kwa n'elu nkù ihe-árú di iche iche ka otù onye nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu gābia: ọ bu kwa rue mb͕e agāwukwasi ngwusi na ihe akara àkà n'aru onye ahu nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.
Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,
Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ:
Ndi nọ kwa n'oké nkume ahu bu ndi were ọṅù nara okwu ahu mb͕e ọ bula ha nuru ya; ma ndia enweghi nkpọrọgwu, ndi kwere na nwa oge, ma n'oge ọnwunwa ha wezuga onwe-ha.
[4] N'ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ, [5] ndi detu-kwa-ra okwu Chineke ire hu ọ di nma, detu kwa ike nile nke oge gaje ibia ire, [6] ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n'obe ọzọ, debe kwa Ya n'ọnọdu-ihere n'iru ọra madu.
[20] N'ihi na asi na, mb͕e ha b͕anariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmazu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist, ewe nime ihe ndia, meri kwa ha, ọnọdu ikpe-azu ha abiawo jọkari ọnọdu mbu njọ. [21] N'ihi na ọ gākawori nma ma ọ buru na ha akāmazughi uzọ ezi omume, kari imazu ya, we si n'ihe di nsọ ahu enyere n'iwu, nke enyere ha n'aka idebe, laghachi. [22] Okwu nke ezi ilu ahu adakwasiwo ha, Ọ bu nkita nke chighariri ọzọ n'ihe ọ b͕ọrọ, buru kwa nne-ezì nke chighariri ọzọ n'ituru n'apiti mb͕e ọ sachasiri onwe-ya.
[26] N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ, [27] kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke. [28] Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n'okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ: [29] ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere?
[3] N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di; [4] ha gēchighari kwa nti-ha ka ha ghara inu ezi-okwu, ma ha gējehie ṅa nti akukọ-irò.
Ọ buru na onye ọ bula anọgideghi nimem, atupu ya n'èzí dika alaka, ọ kpọnwu kwa; ha we chikọta ha, tubà ha n'ọku, ewe rechapu ha ọku.
[1] Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ, [2] site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha;
Ma ndi-amuma ugha putakwara ìhè n'etiti ndi Israel, dika ndi-ozizí ugha gādi kwa n'etiti unu, bú madu ndi gēwere nzuzo webata irọ-òtù di iche iche nke ila-n'iyì, nāgọnari ọbuná Onye-nwe-ha Onye b͕ara ha, ndi nēweta ila-n'iyì di ngwa tukwasi onwe-ha n'isi.
[10] Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì. [11] Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu. [12] N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi.
Ya mere, unu onwe-unu, ndi m'huru n'anya, ebe unu buru uzọ mara ihe ndia, nēchenu onwe-unu nche, ka aghara iwere njehie nke ndi nēmebi iwu bupu unu, unu we si na nguzosi-ike nke aka unu dapu.
Site na nka ọtutu nime ndi nēso uzọ-Ya we laghachi azu, ha esoghi kwa Ya ejeghari ọzọ.
Ndia bu isi-iyi nke miri nādighi, buru kwa alulu nke oké ifufe nēfepu; ndi edebeworo ha itiri nke ọchichiri.
[1] Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ, [2] site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha; [3] ndi nēb͕ochi madu ilu di na nwunye, ndi si kwa madu erila ihe-oriri di iche iche, nke Chineke kère ka ndi kwere ekwe, ndi mazu-kwa-ra ezi-okwu, ka ndi ahu were ekele nara.
Ya mere, onye nēchè na o nēguzo, ya lezi anya ka ọ ghara ida.
[9] Mb͕e ahu ka ha gārara unu nye na nkpab͕u, ha gēb͕u kwa unu: mba nile gākpọ kwa unu asì n'ihi aham. [10] Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì.
[14] Mb͕e ahu otù onye nime ndi-ozi iri na abua ahu, onye anākpọ Judas Iskariot, jekuru ndi-isi-nchu-àjà, [15] si, Gini ka unu nāchọ inyem, mu onwem gārara kwa Ya nye n'aka-unu? Ha we tù orú ego ọla-ọcha na iri nye ya. [16] Site na mb͕e ahu o we chọ oghere irara Ya nye.
[19] nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di: [20] ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.
Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.
[25] ka ayi ghara kwa irapu nzukọ nke onwe-ayi, dika ufọdu nēme, kama ka ayi nādusi ndi ọzọ ọdu ike; ka ayi me kari kwa otú a, n'uzọ ra otú unu nēle ubọchi ahu anya ka ọ nābiaru nso. [26] N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ, [27] kama nke fọduru bu oké olile-anya di egwu nke ikpé, ya na ọku nēre ike ike nke gaje iripia ndi nēguzogide Chineke. [28] Onye ọ bula nke juworo iwu Moses gānwu anwu nēmereghi ya ebere n'okwu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ: [29] ma àhuhu ahu jọkariri njọ ra aṅa, bú nke agāgu na onye ahu kwesiri ka enye ya, ka unu chère, bú onye nke zọworo Ọkpara Chineke ukwu, onye guwo-kwa-ra ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú nke eji do ya nsọ, n'ihe emeruru emeru, onye mewo-kwa-ra Mọ nke amara ihe-ihere? [30] N'ihi na ayi matara Onye ahu Nke siri, Mu nwe ọ́bọ̀, Mu onwem gēnyeghachi. Ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi gēkpe ndi-Ya ikpé. [31] Ọ bu ihe di egwu idabà n'aka Chineke di ndu.
[5] Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya. [6] Ọ gādi kwa ka osisi tamarisk n'ala ihe nādighi, ọ gaghi-ahu kwa mb͕e ọdi-nma nābia; ma ọ gēbi n'ebe nile kpọrọ nku n'ọzara, bú ala nnú ebe madu nēbighi.
Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.
ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.
[20] Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya; [21] ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà.
ma anametiputa arum ọnyá, me kwa ya ka ọ buru orùm: ka mu onwem ghara ighọ onye ajuru aju n'uzọ ọ bula, mb͕e m'kwusasiri okwu Chineke nye ndi ọzọ.
[4] N'ihi na ndi enyere ìhè otù mb͕e, ndi detu-kwa-ra onyinye elu-igwe ahu ire, ndi eme-kwa-ra ka ha keta Mọ Nsọ, [5] ndi detu-kwa-ra okwu Chineke ire hu ọ di nma, detu kwa ike nile nke oge gaje ibia ire, [6] ha we dahie, ọ bu ihe anāpughi ime bu ime ka ha buru ndi ọhu ọzọ ichèghari echèghari; ebe ha nākpọgidere onwe-ha Ọkpara Chineke n'obe ọzọ, debe kwa Ya n'ọnọdu-ihere n'iru ọra madu. [7] N'ihi na ala nke ṅuworo miri-ozuzo nke nēzokwasi ya ọtutu mb͕e, nke nēpuputa kwa nkpa-akwukwọ kwesiri ndi ahu, bú ndi anālu kwa ya ọlu n'ihi ha, ala ahu nēkère ngọzi si n'aka Chineke bia: [8] ma ọ buru na ọ nēweputa ogwu na uke, ọ bu ihe ajuru aju, di kwa ọbubu-ọnu nso; nke ọgwugwu-ya bu ire ya ọku.
eji-kwa-ra okwu-ọnu zí ha ihe bayere gi, na i nēzí ndi-Ju nile ndi nọ n'etiti ndi mba ọzọ irapu Moses, ebe i nāgwa ha ka ha ghara ibì umu-ha úgwù, ka ha ghara kwa ijeso ọme-n'ala nile nke iwu-ayi.
Atọpuru unu n'aru Kraist, unu ndi nāchọ ka ewere iwu gua unu na ndi ezi omume; unu siri n'amara dapu.
Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,
N'ihi na asi na ayi were ọchichọ-obi nānọ na nmehie mb͕e ayi nataworo nmazu nke ezi-okwu, àjà agāchu bayere nmehie di iche iche afọdughi ọzọ,
Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu,
N'ihi na oge gādi mb͕e ha agaghi-anagide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; kama, ebe ha nwere nti nākọ ọkọ, ha gēkpokwasi ndi-ozizí nye onwe-ha dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di;
[3] unu ekwela ka onye ọ bula ghọb͕ue unu n'uzọ ọ bula: n'ihi na ọ gaghi-adi, ma ọ buru na nwezuga ahu ebughi uzọ bia, ewe kpughe onye ahu nēmebi iwu, bú nwa nke ila-n'iyì, [4] onye nēmegide nēweli kwa onwe-ya elu imegide ihe nile anākpọ Chineke ma-ọbu nke bu ihe anāsọpuru dika Chineke; ya mere ọ nānọdu n'ulo nsọ nke Chineke, nēgosi onwe-ya si na ya bu Chineke.
Okwu ahu we ghọ anu-aru, bú madu, O we biri n'etiti ayi, (ayi kiri-kwa-ra otuto-Ya, bú otuto dika otù nwa-nwoke amuru nání ya nānata n'aka nna-ya), O juputara n'amara na ezi-okwu.
Ndikom ufọdu, ndi jọb͕uru onwe-ha, esiwo n'etiti gi pua, we duhie ndi bi n'obodo-ha, si, Ka ayi je fè chi ọzọ òfùfè, (nke ọ nādighi mb͕e unu mara ha);
N'ihi na ọ bu iru nka ka ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nāb͕asi kwa nb͕a ike, n'ihi na ayi elewo anya Chineke di ndu, Onye bu Onye-nzọputa madu nile, ma nke kachasinu Onye nzọputa nke ndi kwere ekwe.
N'ihi na ọ ka nma, ma ọ buru na ọchichọ Chineke chọrọ ya, ka unu hu ahuhu n'ihi na unu nēme ezi ihe kama n'ihi na unu nēme ihe ọjọ.
N'ihi na aririọ ayi nāriọ unu esighi na njehie puta, o sighi kwa n'adighi-ọcha, ọ bughi kwa n'aghughọ:
Jeshurun we ma abuba, we b͕a ukwu: I mawo abuba, i buwo ibù, abuba ekpuchiwo aru-gi: O we rapu Chineke nke mere ya, We kpọ Oké Nkume nke nzọputa-ya onye-nzuzu.
Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, nwua n'ihi ha, n'ajọ omume-ya nke o meworo ka ọ gānwu.
site n'iru-abua nke ndi nēkwu okwu-ugha, ndi eji ígwè ọku da ha n'akọ-na-uche nke aka ha;
O we si ha, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya:
[3] Setan we ba nime Judas onye anakpọ Iskariot, onye di n'ọnu-ọgugu ndi-ozi iri na abua ahu. [4] O we je, ya na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ọchi-agha we kparia, otú ọ gēsi rara Ya nye n'aka-ha. [5] Ha we ṅuria ọṅu, we kwekọ inye ya ego. [6] O we kwere, we nāchọ oghere irara Ya nye n'aka-ha mb͕e ìgwè madu nānọghi.
[31] N'ihi nka ka M'ji si unu, Agāb͕aghara madu nmehie na nkwulu ọ bula; ma agaghi-ab͕aghara nkwulu ekwuluru Mọ Nsọ. [32] Ọzọ, onye ọ bula nke gēkwu okwu megide Nwa nke madu, agāb͕aghara ya; ma onye ọ bula nke gēkwu megide Mọ Nsọ, agaghi-ab͕aghara ya, ọ bughi n'oge a, ọ bughi kwa n'oge nke gaje ibia.
Igbo Bible 2006
Igbo Bible Society of Nigeria 1906, 2006